EHIWELA ÒTÙ IGBO ‘CORPERS CONNECT’, MỊNNA

Spread the love

Mazị̀ Sabastin Nwogwugwu-ọgwụ, Mịnna

Mịnna: Òtù jikọtara ụmụ Igbo bi na Minna  bụ Igbo Community Association (ICA), ngalaba Minna, Naịja Steeti nọrọ ụnyahụ bụ ụbọchị ụka, abalị asatọ nke ọnwa Septemba were hiwe ọgbakọ jikọrọ ụmụ Igbo bịara iji otu afọ éfé Ala nna ha a kpọrọ ‘Igbo Corpers Connect’.

Ọ bụ n’oge ọgbakọ kwa ọnwa ndị ICA nke ọnwa Septemba a ka Onyeisi oche òtù ICA, ngalaba Mịnna, Mazị Ikechukwu Ejezie jiri hiwe ya bụ ọgbakọ.

Ebe ha na-enwe ọgbakọ ahụ bụ n’ime ụlọ ụka Ndị Angịlịkan nke onye nsọ Andru dị na Sabongeri, Mịnna.

N’okwu ya oge ahụ, Mazị Ejezie toro ndị ntorobịa ụmụ Igbo ndị a bịara ìfè ala nna ha na Mịnna, maka mụọ nakwa ọgụgụ isi nke ha nwere ma gosipụta, site na ịchịkọta onwe ha ọnụ.

O kelekwara ha maka ịbịa sonye n’ ịkwalite ọdịmma nke ụmụ Igbo bụ ndị nọ na minna, site n’ iji ihe ndị ha mụtara na mahadum ndị dịgasị iche iche bụ ebe ha gụrụ akwụkwọ wee mugosi ụmụ aka ụmụ Igbo na Minna.

“Ma mbụ, a na m eto unu ka unu si nwee ọgụgụ isi ichepụta òtù a unu kpọrọ Igbo ‘Corpers Connect’ nke unu si na ya enyere ndị Igbo bi na Mịnna aka.

” A na m etokwa Engineer Tony Ohanyeré, bụ onye ndụmọdụ ha n’ụzọ pụrụ iche maka atụmatụ ọma nkea.

Mazi Ejezie rịọkwara ụmụ Igbo nile nọ na Minna arịrịọ n’aha ndị otu ICA, gbasara mkpa ọdị, ịdị na enwe ezi mmekọ oge ọbụla n’ime onwe anyị, ma yara ịdị na akpá oké.

N’okwu ya, Onye Ndụmọdụ òtù Igbo Corpers Connect, Mịnna, Engineer Toni Ọhanyere kelere Onyeisi oche, ICA, ngalaba Mịnna bụ Mazị Ejezie maka ịnabata ihiwe ya bụ òtù ọhụrụ.

Onye Nlekọta òtù Igbo Corpers Connect, Mịnna, Mazị̀ Akachukwu Sịlva kwekwara nkwa na ndị òtù ya agba mbọ eleghị anya n’azụ iji ihe ha mụtara na mahadum were nyere ndị Igbo bi n’obodo ahụ aka.

Hmm, ụmụ Igbo dị egwu! Igbo bụ óké mba!

Leave a Reply

Your email address will not be published.