TSAV, OHU NDỊ FULANI NA-EKWURU ONWE YA-ZOPMAL

Spread the love

Abụja: Ngalaba ndị ntorobịa nke ọgbakọ ndị Mpaghara Obinetiti  Middle Belt Forum, MBF, nọrọ ụbọchị ụka were kọwaa na Alahaji Abubakar Tsav, onye bụbu Kọmishọna ndị Uwe Ojii na Legọs Steeti bụ ohu ndị Fulani ma bụrụkwa onwe ya ka ọ na-ekwuru.

N’ozi onye nyere ndị nta akụkọ n’Abụja, Onyeisi otu a bụ Ịmanụel Zopmal sịrị na okwu Tsav na ndị Obinetiti enweghị ikewapụnwu onwe ya n’ebe ndị Mgbago Ugwu nọ bụ asị e ji etigharị ndị mmadụ anya.

Zopmal kọwara na Tsav bụ ohu nye ndị Fulani, ndị mere ya ihe ọ bụ n’ọrụ uwe ojii maka ire ndị be ha.

Ozi ahụ kwuru sị:”Ngalaba ndị ntorobịa  nke otu Middle Belt Forum ji mwute na-azaghachi ihe otu Alahaji  Abubakar Tsav, onye a sị bụbu Kọmishọna ndị Uwe Ojii kwuru.

“Na ya bụ ajụjụ ọnụ a gbara ya, Tsav rere ihere n’ahịa ma gaa n’ihu ịkparị ndị ndu nile nakwa ndị nile bụ ndị Obinetiti site na ikwu na ndị Obinetiti enweghị ike ikewapụnwu onwe ha n’ebe ndị Mgbago Ugwu nọ.

“Ọ kpọkwara ndị ndu otu Middle Belt Forum ndị mkpọtụ na-anọchiteanya sọọsọ onwe ha. Ọ kwukwara na Dọkịnta Bitrus Pogu na Dọkịnta Isa Doguwa, Onyeisi nakwa Odeakwụkwọ Mgbasa ozi otu MBF.

“Okwu ya atụghị anyị n’anya maka ọ bụ ihe ejiri mara ya. Mana iji mee ka eziokwu pụta, ihe, anyị chọrọ ka o doo ya anya na o tozughi ikwuchite ọnụ ndị be anyị. Ọzọkwa, o nwebughi mgbe o so na MBF ma ya fọdụzịa itinye uche na ihe gbasara ndị Obinetiti.

Hmm, ya kpọtụba

Leave a Reply

Your email address will not be published.