XENOPHOBIA:MPAKO NDIGBO BUTERE YA- JO IGBOKWE

Spread the love

Xenophobia, ka Jo Igbokwe, mba Jo Yorubakwe si na ọ bụ mpako Ndigbo butere ya. Nkea bụkwa ‘ajọ nwa si owere baa nne ya afọ’

Leenụ ihe o kwuru :

“Sọọsọ agbụrụ nwere oke mpako ka Ndigbo ga-awakpo obodo agbụrụ ọzọ ka igurube ma chọọ ka ha na ha hara ma soro nwere ala.

Ndigbo gaa mba ndị ọzọ ma ọ bụ Steeti ọzọ, ha anaghị agba mbọ ọbụla ịnata ma ọ bụ ịkwanyere omenala ndị ha nọ be ha ugwu.

Ndigbo kwesịrị ịgbanwe ndụ ha banyere ịsọpụrụ omenala ndị ọzọ mgbe ọbụla anyị pụrụ mba.

M sịkwa na m abụghị onye Igbo, ha achụgharị m.” -Jo Igbokwe

Ihe nwoke a nwetara na mkparị nile ọ na-akparị Ndigbo bụ na Gọvanọ Legọs Steeti, Sanwo-Olu mere ya onye ndụmọdụ ya na mkpocha ọwa mmiri(gutter/drainage)

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.