TỤFỊAKWA! NWOKE DINARA NWA YA DỊ AFỌ IRI N’ANỌ

Spread the love

Legọs – Ndị ọrụ nchekwa Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC), ngalaba Legọs Steeti anwuchikọwo nwoke dị afọ iri anọ n’isi, Mazị Chinedu Ifeleka maka idina nwa ya nwanyị dị afọ iri n’anọ. 

Ozi sitere n’ọnụ na-ekwuru ụlọ ọrụ ahụ, Oriakụ Kehinde Bada-Okoli, e jidere ya bụ ‘nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu’ ụbọchị Fraịdee gara aga na Mapowu Street, Ojo, Legọs Steeti.

“Nwoke a dinara nwa ya nwanyị ahụ ugboro abụọ oge ọ dị afọ iri n’otu.

” Nwatakịrị ahụ sịrị na ya gwara nne ya mana o meghị ihe ọbụla

O kwukwara na nna ya dinara ya ọzọ n’abalị itoolu nke ọnwa Ọgọọst, ka nne ya gara akwamozu nnenne ya.

Ndị NSCDC sịrị na nwoke ahụ kwetara ihe e boro ya mana ọ sị na ọ bụ sọọsọ otu ugboro ka o mere ya. 

Nne nwatakịrị ahụ,  Oriakụ Flọrịns Ifeleka sịrị na egwu ekweghị ya gaa nye mkpesa maka arụrụ ala ahụ maka na di ya gwara ya na ọ nwaa ya, ya emenye ya egwu.

Onyeisi ndị NSCDC, ngalaba Legọs Steeti, Mazị Cyprian Otoibhi, ka ọ na-egosipụta ndị ahụ e ji eji kwuru sị, “nwoke a ga-ata ahụ etu iwu sịrị dị, a ga-enyefe ya n’aka ụlọ ọrụ kwesịrị ime nnyocha ma kpụpụkwa ya ụlọikpe”

Hmm, arụrụ ala akarịa, ma nwoke a ma nwunye ya bụ ndị arụrụ ala.

Leave a Reply

Your email address will not be published.