ỤKỌCHUKWU ANWỤỌLA N’EBUMỌNỤ ABALỊ IRI ATỌ

Spread the love

Zambia: Otu ụkọchukwu banyere ebumọnụ abalị iri atọ anwụọla n’ime, nke buteziri ọgbaghara n’ụlọ ụka ahụ.

Ụkọchukwu  Brighton Samajomba, dị afọ iri atọ n’asaa nke ụlọ ụka “Heaven Is My Home” na Kazomba dị na mpaghara Solwezi nwụrụ n’abalị iri abụọ nke ebumọnụ nakwa ịchọ ihu Chineke n’isi ezinụlọ ya nakwa ndị ụka ya.

Kaosiladi, Onyeisi ndị Uwe Ojii na mpaghara ahụ bụ Mazi Hudson Namachila sịrị na ya enwetebeghi ozi maka ọdachi ahụ.

Mana Regan Samajomba, nwanne ụkọchukwu ahụ kwuru na e ji ebumọnụ nakwa ime ekpere ogologo oge mara nwanne ya nwoke ahụ lara mmụọ.

O kwukwara na ụkọchukwu ahụ na-emekwa ebumọnụ abalị iri itoolu kwa ọnwa Ọgọọst ọbụla ebe ọ na-eri otu ugboro nri n’ụbọchị.

“Nwunye ya tetara n’isi ụtụtụ gaa ịkọrọ ya nrọ ọ rọrọ. Ọ kwara dị ya aka, ọ megharịghị. E buru ya gbaga ụlọ ọgwụ ndị sịrị na ya bụ nwoke anwụọlarịị

“Sọọsọ nkasi obi anyị bụ na ọ nwụrụ n’ime ụlọ nsọ Jehova”

Nsogbu dịkwa. Igbo si na “ihe na-aka mma n’oke n’abọ”

Leave a Reply

Your email address will not be published.