ANAMBARA:ỤKA ANGỊLỊKAN ACHỤLIWO OGIGE ỌZỤZỤ NYSC N’ALA HA

Spread the love

. . Esemokwu Ụka Angịlikan n’Obianọ kpatara ya

Ọka: Ụka Angịlikan achụliwo ndị ji otu afọ efe ala nna ha bụ National Youth Service Corps, NYSC, n’ogige ọzụzụ ha dị n’Ụmụnya, n’Okpuru Ọchịchị Oyi n’Anambara Steeti.

Ndị ụka ahụ, ndị nwe ebe ahụ e ji mere ogige ọzụzụ nchere oge NYSC na steeti ahụ kemgbe e kepụtara Steeti ahụ n’afọ 1991 kpebiziri iweghara ala ha.

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụnyahụ, onye Nlekọta  NYSC na steeti ahụ bụ Mazị Kehinde Aremu sịrị n’ogige ọzụzụ nchere oge ahụ n’Ụmụnya sịrị na onyenweala ahụ na-abịa ịmalite ọrụ ebe ahụ echi ya.

“Anyị bụ ndị NYSC na-asịzị ndị Ụmụnya ka-emesịa.

Ọ rịọkwara Gọvanọ Anamabra Steeti bụ Wili Obianọ ka ọ gbaa mbọ hụ na ha kwagara n’ogige ọzụzụ nke ndịgide maka na o nweghịkwa ebe ha ga-anọ maka ọzụzụ ha.

Kaosiladi, Odeakwụkwọ ukwu Steeti ahụ, Ọkammụta Solo Chukwulobelu kwere nkwa na Gọọmenti Steeti ahụ ga-enyefe ogige ọzụzụ ndịgide NYSC na steeti ahụ nke dị n’Ụmụawụlụ/Mbaukwu n’aka ndị NYSC n’ọnwa ọzọ dịka otu ihe a ga-eji mee ncheta Nnwereonwe Naịjiriya.

Kepu Kepu anyị na-anụ gosiri na ihe mere Ụka Angịlikan jiri sie ọnwụ iweghara ala ahụ ugbua bụ maka nghọtahie dị n’etiti ha na Gọvanọ Obianọ, onye ga sịrị na-akpagbu ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published.