APC JI NJỌ KWỤỌ M ỤGWỌ MMA-OKORỌCHA

Spread the love

Abụja: Gọvanọ rituru n’ọkwa n’Imo Steeti, Rochas Okorocha, eboola otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC ebubo iji ihe ọjọọ kwụọ ya ụgwọ ahụhụ nile ọ tara maka ha na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda Naịjiriya.

O cheere aka mgba nye onye nọchiri ya n’ọkwa bụ  Emeka Ihedioha, ka o nyochaa ọchịchị ya, na o nweghị ọchịchị steeti ahụ ga ahụnwu azụ ya anya.

Ọ sịrị, “APC ji njọ kwụọ m ụgwọ mma. E nweghị udiri iche aka mgba m’ enweghị, o nweghị udiri mkparị m’ anataghị.

” Ha kpọtara ndị busoro m agha oge m na-ehi we otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ na steeti ka ha bịa napụ ikike na ya bụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị. Achọghị m ikwu maka ya mana ha emetaghi ya.

Ka ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu, Okorọcha kwupụtara na ụjọ ji ya na APC ga-anwụ ma Buhari rituo n’ọkwa.

“Ọ nwebeghi mgbe m chere echiche maka ịhapụ APC. Sọọsọ ihe na-eche m bụ na APC ga-anwụ ma ọ bụrụ na elebagbi na mkpagbu nile juru n’ime APC.

Leave a Reply

Your email address will not be published.