NTIKPỌ ỤLỌ EKPERE ALAKỤBA:O NWEGHỊ IHE NA-EME- WIKE

Spread the love

Igwe Ọcha: Gọvanọ Rivas Steeti, Nyesom Wike,ekwuola hoo!haa! na o nweghị ihe na-eme, na ya ka kwụ ebe ya kwa n’asịrị ndị ụfọdụ ji ya akụ maka ntikpọ ụlọ ekpere ndị Alakụba na steeti ya.

Wike kwuru nkea ụbọchị ụka oge onyeisi oche ọgbakọ ndị Gọvanọ Naịjiriya bụ  Nigeria Governors’ Forum (NGF), Kayode Fayemi, bịara hụ ebe ụlọ ekpere Alakụba ahụ a sị na ọ kụturu nọ.

Fayemi bịara Igwe Ọcha iji mata nke bụ eziokwu banyere okwu ahụ.

Wike kwuru na ebe ahụ a sị n’ụlọ ekpere ndị Alakụba ahụ dị bụ ọdọ mkpofu nsị́ (sewage dump).

O kwuru sị:”Ọ nweghị ihe m nwere megide ndị Alakụba ma ọ bụ ndị otu okpukperechi ọbụla.Dika i siri hụ, o nweghị mgbe ụlọ ekpere Alakụba jibu dị ebea kama ọ bụ ọdọ mkpofu nsị́ nke gọọmenti Steeti a na ụfọdụ ndị chọrọ ịrụ ya ụlọ na-azọ.”

O tokwara Fayemi maka ezigbo ala ọchịchị ya nke mere na o soghi ndị mapụtara n’ike were tinye ọnụ n’okwu ahụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.