ODOGWU BỊAFRA:GỊNỊ BỤ ESEMOKWU NNAMDI N’ASARI?

Spread the love

Kemgbe Ikemba Emeka Ojukwu(Ezeigbo gburugburu, Amụma n’égbé ìgwè, Odenigbo Ngwo) nwụchara ụmụ Biafra ka na-achọ onye ndu ọzọ.

Mazi Nnamdi Kehinde Kanu, onye ndu otu IPOB nakwa Mujahedeen Asari Dokubo bụ ndị odogwu abụọ ụmụ Biafra na-ele anya nwere ike idu ha.

Ha abụọ nwe gara ebe ha riri amosu. Nnamdị Kehinde Kanụ bụ ọkaibe n’agha egbe ọnụ (propaganda). Kaọdịtaa, o nweghị onye hụrụ azụ ya anya na ngalaba ịgba egbe ọnụ.

O jiri ọnụ mee Buhari aghọọ Jubril Al Sudaini, werekwa ọnụ chụlaa Atiku Kameruun. Ruo ma taa, ‘ụmụ nwanne’ Atiku na Kameruun ka na-akpọ ya oku ka ọ lata.

Kanụ jikwa egbe ọnụ chọrọ ịkpụtọ Sinetọ Ike Ekweremadu n’ala, n’agbanyeghị mbọ nile nwamadị gbara iji gbapụta ya na nga tinyekwara mmekpa ahụ nile ọ natara n’aka Gọọmenti Buhari n’ihi nkea.

N’aka nke ọzọ, Asarị Dokubo bụzị ọchịagha jeworo ọgụ ugboro ugboro turu ugo lata. Ụda egbe n’ogbunigwe anaghịkwa eyi ya egwu maka na “o jiri ịkwa mgbọ kwata ihe o ji bụrụ mmadụ”

Gịnị mere ha abụọ agaghị ejikọnwu aka ọnụ were gbaa mbọ maka nnweere onwe mba Biafra?

N’ezie, Biafra abụghị sọọsọ maka Ndigbo. Ọ dị oke mkpa na nkéjì (bloc) atọ e nwere na Biafra bụ Ala-Igbo, Akwa Cross na Ndị Mba Mmiri ga-eso nke ọma n’ihe ọbụla banyere ọgụ nnwere onwe Biafra.

Keduzi ihe na-esere odogwu Biafra abụọ a okwu?Ọ bụ nwanyị ka ọ bụ ego na-esere ha?

Onye nta akụkọ anyị bụ Jọn GreenHart mere nnyocha pụrụ iche ma gakwaa njem n’ime ime Mba Mmiri ịgba ndị ọchịagha ha ajụjụ ọnụ. Chebiri anyị ụbọchị Mọnde, abalị iri n’isii nke ọnwa a bụ Ọgọọst iji nweta akụkọ ahụ n’uju

Leave a Reply

Your email address will not be published.