NNA NNAMDI KEHINDE KANỤ ALỌTAWO AFARAUKWU

Spread the love

Ụmụahịa: Eze Izrel Kanụ, nna onyeisi IPOB bụ Mazi Nnamdi Kehinde Kanu alọtawo obi ya n’Afaraukwu, Ibeku, Ụmụahia, Abia Steeti.

Site n’ozi anyị nwetara n’aka onye ma ezinụlọ ahụ nke ọma, onye eze ahụ ndị mmadụ hụrụ n’anya lọghachiri n’obi ya abalị atọ gara aga, ebe ọ nọrọ na-anabata ndị ọbịa. Ozi ahụ kọwakwara na ahụ siri ya ike.

Eze Kanu na ndị ezinụlọ ya ndị ọzọ tinyekwara nwunye ya, Ugoeze Nnenne Kanu gbapụrụ n’Afaraukwu ka ndị soja na-achọ ịmalite mwakpo Egwu Eke II.

Kemgbe ahụ, ezinụlọ Eze Izrel Kanụ nọzị na Lọndọn, mba Briteenụ

Egwu Eke ahụ siri abalị iri n’anọ nke ọnwa Septemba ruo n’abalị iri n’ise nke ọnwa Ọktoba  2017.

Onye mgbasa ozi IPOB, Mazi Emma ‘Powerful’ Kanu nọrọ taa, zipụ ozi  nke o jiri “mee ka, ụwa mara na a na-achọkwa ịwakpo Afaraukwu” ọzọ n’ihi ụgbọala ndị Uwe Ojii akwụwagasịrị n’ihu obi Eze Kanụ.

IPOB bokwara Gọọmenti ebubo ịkwụwa “otu ndị ogbu ọchụ” n’ihu ụlọ  ahụ.

Kaosiladi, nnyocha anyị mere gosiri na ụgbọala ndị Uwe ojii ndị ahụ abụghị maka ịwakpo ndị Afaraukwu.

Kama na ndị Uwe Ojii nwetara ozi na ndị IPOB chọrọ ime mmemme iji cheta afọ abụọ nke mmalite Egwu Eke taa bụ abalị iri n’ise nke ọnwa Septemba.

Nkea meziri ndị Uwe Ojii jiri kwụwagasịa ụgbọala ha n’akụkụ ebe ahụ iji gbochie ọgbaghara ọbụla idapụta na mmemme ahụ.

N’ezie, ihe na-ewu n’Ụmụahịhịa ugbua bụ na nlọghachi nna ya nwere bụrụ ịkwado maka nlọghachi nke Mazi Nnamdi Kehinde Kanu onwe ya n’Afaraukwu

Leave a Reply

Your email address will not be published.