9 Comments

  1. 1. Nwanyị mara obi Di ya ọdị ka ọ gworo ọgwụ.
    2. Nwanyị Di ya kpọrọ asị apụghị isite ya n’ofe dị utọ.
    3. Ama nwanyị gbara Di ya bụ fụghem.
    4. Ahịa anaghị aghọ nwa agbọghọbịa ụzọ abụọ, ọdịghị mma ọlụlụ ọ dị mma enyi.
    5. Ihe mere nwoke alụbeghị nwanyị mere nwoke alụbeghị Di.
    6. Nwoke na-alụ nwanyị mechiri ahụ ọ dị ka ndị obodo ya a na-asọ anụ nchi.
    7. Nwanyị makarịa Dị ya n’ụzọ, ihe chere Di ya ewere ya.
    8. Nwoke mara obi nwunye ya ọ chịnye ya igodo ụlọ.
    9. Nwanyị na-azọ mgbala buru ụzọ zọọ Di ya.
    10. Ogoli bịa mbụ Ị mee ya ọkacha mma, ọmewe ngala.
    11. Nnekwu ọkụkọ sị okeọkpa na ọbụrụ na ya matara na ihe ọ na-akpọrọ ya ga-ebi ọsọọsọ na ya kaara ịhapụ ịgba isi ụlọ okirikiri.
    12. Nne wetere ji ka oju afọ, nna webilatara ya ka ọpụ echi; ikpe amaghị nna nke oji ama nne.
    13. Ihe nwoke jụrụ ma werekwa bụ naanị nwụnye ya.
    14. Nnekwu ọkụkọ kwuru sị na ọbụghị ọlụlu okeọkpa na-alụ ya na-ewe ya iwe, kama na ọbụ mmebọ ọ na-emebọ ya n’ihu ọha.
    15. Ọ na abụ nwanyị karịa Di ya, mgbala ya akaa.
    16. Ọ na abụ chi foo nnekwu ọkụkọ enwee Di .
    17. Ọ na abụ a na-eli nwoke nwụrụ anwụ, a na-akpọ aha onye ga-ekuchi nwunye ya.
    18. Ọ dị ka ya lụbam anaghị eji ego.
    19. Nwanyị gbara ọsọ na be di ya na abụ nlata gụba ya ọ gaa ịkpa nkụ n’owere Di ya.
    20. Okeọkpa ka ajụrụ ego ole eji alụ nwanyị na be ha. Ọzara sị na ọ naghị eri ego ọbụla kama ihe ọ na-eri bụ ịdịkwa ike ọsọ.




    0



    0
  2. Ka aka ra nwanyi ka ọ na-atukwasa dị ya.




    0



    0
  3. 1. Nwunye awọ sị di atọka ụtọ ya jiri lụọ nke ya kwọrọ ya na azụ.
    2. Nwanyị mụta isi ofe mmiri mmiri, di ya amụta ịpị ụtara aka esuru ofe.




    0



    0
  4. 2.ogoli mara obi dị ya, asi na oji ọgwụ jide dị ya.

    3. Igaghi àgwà nwanyị ihe si ya agwala dị ya.

    4. Agbala dị mma na ahụ dị n’anya




    0



    0
  5. 21. Ogoli nnuo di na abo ohoro nke ka ya mma
    22. Ọ na abụ ọmụmụ hịawa ahụ, nwoke a na-abịa nso, nwanyị a na-abịa.
    23. Nwoke chi ọjọọ na abụ ọmaa nwunye ya ụra ọbịa ya n’ụkwụ zaa.
    24. Onye na-egbo nna ya iti nne ya ihe aghaghị ịgwa nne ya ka ọmechilata ọnụ ya.
    25. Nwoke ji nwanyị abụọ na ebukarị ọnụ alakpu ụra mgbe ọbụla.
    26. Ọ na-abụ nwanyị lelịa Di ya ike akpọọ ya nkụ.
    27. Nwanyị sị na ikpe ya na Di ya abụghị nke mmadụ, ọ bụ ndị mmụọ ga-ekpere ha ya.
    28 Nwanyị mara ihe bụ okpu eze Di ya.
    29. Di bụ ugwu nwanyị.
    30. Onye emeghị ka onye ara ụmụ nna ya agaghị alụnye ya nwanyị.




    0



    0
  6. Author

    1. Nwa ekweghị mbe ọmụmụ, ọ si na nwunye dị ya na-ele ya ajọ anya
    2. Ogiri lụọ di abụọ, ọ mara nke ka ya mma
    3. Onye kpubara ụlọ nwaanyị ọmụgwọ mara ihe ọ mụrụ
    4. Nwanyị mụta isi ofe mmiri mmiri, di ya amụta ịpị utara aka
    5. Ụzọ nlụta nwanyị abụghị ụzọ mmụta nwa




    0



    0
  7. Author

    1. Ilu nwaanyị abụghị ịnụ ihe na ntị
    2. Alụmdi na nwunye bụ akpa, ihe onye tọtara ọ were
    3. Onye chọrọ ịlụ nwaanyị ga-ebu ụzọ zuo nkịta, i zụnwuo ya mara na ị ruola ogo ịlụ nwaanyị
    4. Nwanyị gafee onye mụrụ, o ruo onye na-alụ
    5. Nwanyị di ya nwụrụ si a na-ekwu okwu ili dị ya, sị na-ekwu okwu onye ga-akụchi ya
    6. Ọgọ bụ chi onye.
    7. Mmanya e jiri bịa okwu nwaanyị anaghịkwa alaghachi azụ
    8. Nwanyị dị ime ma onye tụwara ya ya
    9. E ji m ụjọ agakwu nwaanyị ajadụ, dị ya anọ ya?
    10. Alụmdi na nwunye bụ ụzọ mmiri, ọ bụghị ụzọ nkụ




    0



    0
  8. Author

    ỌGBỤGBA OKWE: UJU NWANEKEZIE 30 (30), MAZỊ IKECHUKWU ỌJỊ 10 (7), CHUKWUDI OKEKE 4(4),DỌKỊNTA ACHỤKỌ 3(3)




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.