NNUKWU ỌDỊICHE N’ỤGWỌ ỌRỤ NDỊ ỌCHỊCHỊ NA NDỊ ỌRỤ NDỊ ỌZỌ BUTERE MPỤ NA NAỊJIRIYA – GLORIYA OKOLUGBO

Spread the love

Abụja: Gloriya Okolugbo, otu onye ọbịa sonyere n’ihe mmemme ụlọ ọrụ mgbasa ozi NTA, Good Morning Nigeria nọrọ n’ụtụtụ taa were kwuo na ihe soro bute ajọ akparamagwa na mpụ ịrị ibe ya elu na Naịjiriya bụ nnukwu ọdịiche dị n’etiti ụgwọ ọnwa ndị nọ n’ọkwa ọchịchị na ndị ọrụ ndị ọzọ nke ọ sị tere anya dịka site Naịjiriya gawa mba Ọstrelịya.

Okolugbo, onye bụbuworo Kọmishọna na Delta Steeti, ugboro ugboro kwuru nkea oge ọ na-etinye ọnụ na mkparịta ụka nke isi okwu ya bụ : Usoro Akparamagwa Naịjiriya, Kedu ebe anyị nọrọ gbajọọ ya?

“Ebe nsogbu anyị nwere ugbua nke bụ na mpụ n’ajọ akparamagwa na-arịzị ibe ya elu na Naịjiriya hiwere ụkwụ bụ nnukwu ọdịiche dị n’etiti ụgwọ ọrụ ndị ji ọkwa ọchịchị dị iche iche na nke ndị ọrụ ndị ọzọ.

“Udiri ụgwọ ọnwa tinyere ego mmachi akpa (allowances) ndị nọ n’ọkwa ọchịchị dịka ndị Gọvanọ, ndị mịnịsta, ndị Sinetọ, wdg na-eri na-awụ akpata oyi.

” O meziri ka ndị mmadụ were na ihe e ji abanye n’ọchịchị bụ ibute ego. N’agbanyeghị ihe i meere ndị mmadụ ka ị nọ n’ọkwa, ọ gaghị atụ ha anya maka ha weere na ọ bụ ego ha i zuuru ka ị na-ewepụta.

N’okwu ya, Dọkịnta Garba Abari, Onye Nlekọta Ukwu, ụlọ ọrụ National Orientation Agency (NOA) kọwara na ekwentị ọgbara ọhụrụ (Smart phone) sozi emebi ụmụaka ugbua

“Ọtụtụ oge, ụmụaka nakwa ndị ntorobịa na-ejizi ekwentị ọgbara ọhụrụ ha emere ikwu n’ibe. Ha na-echenye n’ekwentị ntị ha mgbe nile. Oge nile, ha nọ na whatsapp, snapchat, Instagram, wdg,

” Nke meziri ha ji achọ ịmụrụ ihe ndị ọjọọ ndị ọcha na-eme dịka enweghịzi nsọpụrụ nye nne na nna nakwa ndị okenye ndị ọzọ tinyekwara ejighị ikwu n’ibe were kpọrọ ihe.

” N’aka nke ọzọ, anyị achọghịzị iṅomi usoro obibi ndụ ndị ọcha ebe o metụtara ichu uchu n’ọrụ nakwa ime ihe n’usoro ya”

Dọkịnta Abari kowakwara na nnukwute ọrụ dịịrị ndị nne na nna n’ịhụ na ụmụaka ha mụtara igbaso ezigbo usoro akparamagwa iji mee ka ha bụrụ ezigbo ụmụ amaala Naịjiriya.

“Ndị nne na nna kwesịrị ịma ihe ụmụ ha na-eme na kọmputa nakwa n’ekwentị ha”

Leave a Reply

Your email address will not be published.