UGWUANYỊ AGBAGHEELA ỤLỌ ỌGWỤ UKWU ABỤỌ OTU ỤBỌCHỊ

Spread the love

…Gọọmenti akwụọla otu narị nde Naịra dịka oke ego ya maka usoro ahụike ‘Universal Health Coverage’ 

Enugwu: Gọvanọ Enugwu Steeti, Rt. Hon. Ifeanyi Ugwuanyi nọrọ ụbọchị Tuuzdee were gbaghee ụlọ ọgwụ ụkwụ (General Hospital) abụọ na steeti ahụ.

Ha gụnyere Ụlọ ọgwụ ukwu Poly, Asata, dị n’okpuru Ọchịchị Enugwu Mgbago Ugwu ya, na Ụlọ ọgwụ ukwu Udi dị n’Okpuru Ọchịchị Udi ndị nke a rụgharịrị, bulizie elu ma kwanyekwa akara gwa kwesiri ekwesị iji nye ndị Steeti ahụ ahụike zuru oke.

Ka ọ na-agbagheela ụlọ ọgwụ ukwu Poly, nke a mabu dịka Poly Clinic, Ugwuanyị kọwara ụlọ ọgwụ ahụ dịka “ụlọ ọgwụ ukwu kacha ekwo ekwo na steeti ahụ ma bụrụkwa ogige ahụike nke abụọ na steeti ahụ ma ụlọ ọgwụ Parklane gachaa”

Ugwuanyi kọwara na Poly so n’ụlọ ọgwụ ukwu asaa na-enye ndị mmadụ nlekọta ahụike zuru okè, tinyere ụlọ ọgwụ nta(cottage hospital) iri anọ n’atọ (43) ya na ogige ahụike narị iri anọ.

Ugwuanyị kwupụtara na Gọọmenti ya akwụọla otu narị nde Naịra (N100m) dịka oke ego ya maka usoro ahụike ‘Universal Health Coverage’.

Na mgbaghe ụlọ ọgwụ ukwu Udi, Gọvanọ Ugwuanyi kọwara na ya bụ ụlọ ọgwụ bụ sọọsọ ụlọ ọgwụ ukwu dị na mpaghara Udi/Ezeagụ nke mere ọchịchị ya jiri dozie ma bulikwaa ya.

N’okwu ya, Onyeisi, otu nlekọta ụlọ ọgwụ na steeti ahụ, Hospital Management Board, Dọkịnta Okechukwu Ossai kelere Gọvanọ Ugwuanyi maka iweta ezi mgbanye n’usoro ahụike na steeti ahụ

“Taa, e kelere m Chineke nakwa Gọvanọ anyị na ọ bụ n’ọchịchị m ka e buliri ọ ọgwụ ndị a elu dịka ụlọ ọgwụ ukwu zuru ezu”

Ndị isioche Okpuru Ọchịchị Mgbago Ugwu Enugwu nakwa Udi, Hon. Emma Onoh na Hon. Nestor Ochin toro gọvanọ ahụ maka mbọ eleghị anya n’azụ ya maka iweta udo nakwa ezi ọchịchị n’Enugwu Steeti.

Leave a Reply

Your email address will not be published.