AKPỌMASỊ MBÀ:ZIMBABWE EWEPUWO AHA NWA SAWỤT AFRỊKA NA MMEMME MAPOPOMA

Spread the love

Harare, Zimbabwe: Ndi nhazi Mmemme  Mapopoma na Zimbabwe ewepụwo aha nwa Sawụt Afrịka na-ewu ewu n’agụm egwu bụ Babes Wodumo n’aha ndị ga-agụ egwu na mmemme ahụ maka na ọ na-akwado akpọmasị mbà(xenophobia).

Babes Wodumo agaghịkwa esonye na mmemme ahụ a ga-eme n’ogige Victoria Falls Sports Club na Victoria Falls, Zimbabwe, site n’abalị iri abụọ n’itolu ruo abalị iri atọ n’otu nke ọnwa Disemba afọ a nke ọ gara ịbụ isi sekpu ntị n’ime ndị nile na-agụ egwu e ziri.

Babes Wodumo na nwa-afọ Naịjiriya bụ Ice Prince gbakọrịtara egbe ọnụ kporo ọkụ n’ámáozi Twitter banyere okwu akpọmasị mbà na-aga n’ihu na mba Sawụt Afrịka.

O boro ndị Naịjiriya ebubo imebi obodo ha site n’ibubata ọgwụ ike na mba Sawụt Afrịka nke buteziri akpọmasị mbà.

Nwa agbọghọ ahụ bokwara ndị Zimbabwe ebubo izuru ụlọ RDP bụ ụlọ maka ndị ogbenye na mba Sawụt Afrịka nke e mebere maka ndị be ha.

Kaosiladi, o mechara sị na-etiwara akara Twitter ya, na ọ bụghị ya kwuru ihe ndị ahụ.

Na mmemme akwamozu Rọbọt Mugabe, Onyeisiala mba Zimbabwe laworo mmụọ, n’izu ụka gara aga, ndị Zimbabwe mere Sịrịl Ramaphosa, Onyeisiala mba Sawụt Afrịka akaja dị egwu nke mere na ọ rịọrọ mgbaghara.

Hmm, nsogbu dị! Gịnị mere na mba Sawụt Afrịka amaghị ihe ọma chaa chaa?

Leave a Reply

Your email address will not be published.