IPOB ENWEGHỊ IKE IWAKPO M- NGIGE

Spread the love

… IPOB adapụla n’ebumnobi Ikedife dịka onye soro hiwe ya. 

Ọnịcha: Dọkịnta Nwabụeze Chris Ngige, Mịnịsta maka Ọrụ, ekwuola hoo!haa! na ndị IPOB enweghị ike iwakpo ya ma gaa mba ofesi.

Ngige kọwara na nke a bụ maka na ya zụrụ ndị otu ahụ nri ma chekwakwaa ihe gbasara ha oge ọ bụ Gọvanọ Anambara Steeti.

N’okwu ya, oge ọ bịara mmemme n’Obosi, Anambara Steeti na ngwụcha izu ụka gara aga, ọ kọwara na ọ bụ ya mere ha ji nye ya nnabata pụrụ iche oge ọ gara Amerịka nso nso a.

“IPOB bụ onye bụbu Nnukwu Onyeisi  Ohaneze Ndigbo, Dọkịnta Dozie Ikedife nakwa ndị Igbo ndị ọzọ mere ndebanye aha ya dịka otu n’anaghị eme ọgbaghara.

“Ihe ha na-emezi ugbua esoghị n’ebumnobi nakwa atụmatụ nhiwe ha. Oge m gara Amerịka na nso a, ndị IPOB nabatara n’ụzọ pụrụ iche”

Ngige kọwakwara ihe jikọrọ ya na ndị IPOB

“Ha ma na m zụrụ ha nri ma nyekwa ha nchekwa oge m bụ Gọvanọ.

” E kwuola m ya ugboro ugboro na Biafra abụghị ihe a ga-enweta n’ụzọ a IPOB si eme.

O nyekwara Ndigbo ndụmọdụ

“Ndigbo kwesịrị ịkwụsị ịnọ na-eti mkpu mmegbu oge nile. Ha kwesịrị ibili ma kwudosie ike ka e were gụnye ha.

“Usoro ime ihe ziri ezi gosiri na o ruuru Ndigbo iweta onyeisiala ọzọ na Naịjiriya. Kaosiladi, ha ga-arụsi ọrụ ike ma kwụwa onwe ha nke ọma maka nkea

“Ka anyị kwụsị ogologo akụkọ na sịị sịị sịị. Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị anaghị enye mmadụ ọchịchị maka ime obi ebere. Onyeisiala Buhari ekwuola na ya nabatara onye Igbo ịnọchị ya dịka Onyeisiala.

“Anyị nile ga-akwadoriri ma ya ma APC. O nweghị onye ga-ekpubata n’ime ụlọ nrahụ (bedroom) gị were ọkwa onyeisiala nye gị ”

Chetakwa na otu Indigenous Peoples of Biafra (IPOB) bụ ndị ochie dike Ala-Igbo hiwere ya ebe onye bụbu Nnukwu Onyeisi otu Ọhaneze Ndigbo, Igwe(Ọkaikpe) Ezebuilo Ozobu bụ onyeisi oche, Dọkịnta Dozie Ikedife laworo mmụọ, bụbukwa Nnukwu Onyeisi, Ohaneze Ndigbo bụ Osote Onyeisi oche ebe Colonel Jo Achụzịa, onye bụbukwa Odeakwụkwọ ukwu, Ọhaneze Ndigbo bụ odeakwụkwọ. 

Ndị ochie dike ndia bụ ihe mebere ọgbakọ ndị okenye IPOB a na-akpọ Elders Council of the Supreme Council of the Indigenous Peoples of Biafra.

Hmm, Ọnwaaaaaaaa! Keduzi ihe kara gị obi ikwu na IPOB agaghị awakponwu gị ebe ị hụrụ na IPOB achọghịdị ịma onye nwụrụ a na-atụ ụzụ akwa ya? Ị kakwara aka!

Leave a Reply

Your email address will not be published.