ỤGWỌ E JI NDỊ SUPER EAGLES:ICPC KWESỊRỊ ILEBA YA ANYA-KỊNGSLỊ ỌSADỌLỌ

Spread the love

Abuja: Nkatọ sitere n’aka ọhaneze ka sochikwara akwụghi ndị otu egwuregwu Super Eagles ala anyị nakwa ndị nlekọta ha, ụgwọ nile nakwa ego mmachi akpa nile e kwesịrị ịkwụ ha, kemgbe ọnwa abụọ ha jiri gbata ndị nke atọ n’Asommpi Egwu Bọl mba Afrịka bụ AFCON n’agbanyeghị na Gọọmenti ewepụtala ego ahụ oge ha ka nọrịị n’Ijipt.

Mazị Kịnslị Ọsadọlọ, onye nhazi mmemme ụlọ ọrụ mgbasa ozi NTA bụ ‘Good Morning Nigeria’ na-ewu ewu makwara bekee, nọrọ ụnyahụ na mmemme ahụ tụpụta alo ka  ụlọ ọrụ na-emegide ngarị dịka ICPC nakwa EFCC lebanye okwu ahụ anya.

“Ụlọ ọrụ ICPC nakwa EFCC kwesịrị ilebanye okwu ahụ anya ozigbo iji chọpụta onye ji ego ahụ nke Gọọmenti wepụtaworo.

Ọzọkwa, e kwesịrị ime ka ọ bụrụ iwu na ụlọ ọrụ ndị a na-emegide ngarị ga-esochi ego ndị ahụ azụ ozigbo e wepụtara ha iji belata nsogbu akwụghi ndị otu egwuregwu ụgwọ ha oge o kwesịrị nke na-ebutere ha mmụọ ịda mba.

Otu a ka e siri jide onye nkuzi bọl otu egwu bọl ụmụ nwanyị ala anyị Super Falcons, Tọmọs Dennerby ụgwọ nke so n’ihe o jiri gbaa alụkwaghịm na ngwụcha izu ụka gara aga.

Kaọdịtaa, ụlọ ọrụ ICPC nọrọ n’izu ụka gara aga weghara agada ụlọ nke onyeisi nakwa osote onyeisi otu nchịkọba asọmmpi egwu bọl na Naịjiriya bụ Nigerian Football Federation (NFF), Amaju Pinnick na Shehu Dikko n’otu n’otu.

Ụlọ ndị a bụ ụlọ Pinnick dị n’Ikoyi, Legọs Steeti tinyekwara nke Dikko dị na Maitama, Abuja.

Ọ dị mma ‘ịgba ụzọ azụ owere mgba’ na o teela ndị a mewere mmadụ ihe.

Leave a Reply

Your email address will not be published.