ỤLỌ ỌRỤ OSINBAJO GBAZỊ ỌTỌ – AFENIFERE

Spread the love

Legọs: Mazị Yinka Odumakin, ọnụ na-ekwuru otu Afenifere, akọwaala na site na ka ihe si agazi ugbua, na ụlọ ọrụ Osote Onyeisiala bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo gbazị ọtọ ma bụrụzịa ihe n’abaghịkwa uru.

Kaosiladi, Odumakin sị na “chi ka bụ ụtụtụ” iji mata ma ihe a Osinbajo na-agabiga abụ maka nzọhie ụkwụ ọ zọhiere n’ọrụ ka ọ bụ maka ịzụ okwe ikwado nhọpụta onyeisiala nke afọ 2023.

Odumakin kwuru nkea ụbọchị Wenezdee na Legọs, oge ọ gwara ndị nta akụkọ okwu.

O kwuru sị, “Ka anyị na-aga n’ubi ka ji na-áka. Anyị na-eleba okwu ahụ anya mana anyị achọghị ịghakọta okwu.

” Kaọdịtaa, anyị agaghị ekpebi ozigbo ozigbo na ọ bụ sọọsọ okwu nhọpụta 2023 butere ya.”

Chetakwa na ụlọ ọrụ Onyeisiala nọrọ ụbọchị Mọnde kposaa otu nlekọta akụnụba, Economic Management Team (EMT), Osinbajo nọbu n’isi ya ma werezịa otu Ndụmọdụ Akụnụba, Economic Advisory Council (EAC), Ọkammụta Doyin Salami nọzị n’isi ya were nọchie ya.

Ndị ọzọ nọ n’otu ọhụrụ ahụ gụnyere Dọkịnta Mohammed Sagagi (Osote Onyeisi oche), Ọkammụta Chukwuma Soludo,  ỌkammụtaOde Ojowu, Dọkịnta Shehu Yahaya, Dọkịnta Iyabo Masha, Mazị Bismark Rewane, tinyekwara Dọkịnta Mohammed Adaya Salisu (Odeakwụkwọ).

Onye ndụmọdụ Onyeisiala n’okwu mgbasa ozi, Mazị Femi Adesina, kwuru na otu ndụmọdụ ahụ “na Onyeisiala n’onwe ya ga na-arụkọ”

Ka eguzobechara ya bụ EAC, a na-anụkwa kepu kepu na a chọrọ iwegazị ụfọdụ ndị ọrụ osote onyeisiala welitere isi na mịnịstrị tinyekwara ụlọ ọrụ Gọọmenti ndị ọzọ.

Nke ka nke bụ na Onyeisiala nyeziri ntụziaka na Osinbajo gana anata ikike n’aka ya tupu o kpebie ime ihe ọbụla n’ụlọ ọrụ ndị ọ na-elekọta dịka National Emergency Management Agency (NEMA),  National Boundary Commission (NBC), Niger Delta Power Holding Company (NDPHC) nakwa Border Communities Development Agency (BCDA), wdg.
N’agba mbụ nke ọchịchị ha, e boro Osinbajo ebubo izupu ego site n’ụlọ ọrụ ndị ahụ nọ ya n’okpuru.
Iji maa atụ, Osinbajo onye bụ ụkọchukwu ndị ụka Redeemed Christian Church of God ka Kọmitii nke Ụlọ Nzukọ Omebeiwu nta nke Naịjiriya mara ikpe maka iri ngarị nde naịra ise n’ụma asatọ (N5.8m) n’ụlọ ọrụ NEMA. 
Ugbua ka Osinbajo ga-amata na o soghi n’ihe a na-eme. Eleghị anya, o chefuru na ọrụ osote onyeisiala bụ “sọọsọ ịga akwamozu n’aha onyeisiala nakwa ịgụ akwụkwọ akụkọ”
Ugbua ka ọ ga – amatazị na “catch am” bụ jide ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.