EL RUFAI CHỌRỌ ITIKPO ỤLỌ ỤKA DIWORO OTU NARỊ AFỌ

Spread the love

… Ịbọrọ ọbọ maka ụlọ ụka Alakụba a siri na Gọọmenti Rivas Steeti tikpọrọ

Kaduna: Otu Christian Association of Nigeria (CAN), ngalaba Kaduna Steeti akatoola ozi nkwapụ ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka mmepe obodo, Kaduna State Urban Planning Development Agency zigaara ụlọ ụka ndị Angịlịkan Onye Nsọ Jọọjị na Sabon Gari, Zarịya diworo otu narị afọ. 

Ụlọ ọrụ ahụ na-ekwu na ozi nkwapụ( seven day notice) abalị asaa ahụ sitere na ntuzi aka Gọvanọ Steeti ahụ, Nasir El-Rufai, maka atụmatụ ịgbasapụ ahịa  Sabon Gari.

O nweghị onye etinyere aha ya n’akwụkwọ ozi ahụ sọọsọ ihe e dere ya bụ na o si n’aka na ya bụ akwụkwọ ozi  “Zonal head” nke ụlọ ọrụ KASUPDA onye nochitereanya “Zonal Manager.”

Kaosiladi, Onyeisi oche CAN na steeti ahụ, Ụkọchukwu Josef Hayab, nọrọ ụbọchị Tọọzdee were katọọ ya bụ ozi nkwapụ ahụ.

“Na Febrụwarị afọ 2016, Gọọmenti chọrọ ibugharị ụlọ ụka ahụ iji mee ka ahịa gbasapụkwuo tupu chọpụta na ụka ahụ nwezuru akwụkwọ nile kwesịrị ekwesị, na akụkụ ahịa ahụ dịrịị n’ala ụka.

“N’ihi ya, e kpeziri okwu ahụ n’udo. Anyị chọrọ ime ka o doo anya na o nweghị ego iti aka n’obi ọbụla e nyere ụka ahụ.

“Kedụ ka Gọvanọ ga-esi laghachi azụ n’okwu e dozichara n’udo n’afọ 2016?.

“Ihe a yiri aka ọrụ ndị agamnihu Kaduna Steeti”

Kaosiladi, ọtụtụ na-eche na ọ bụ maka ụlọ ụka ndị Alakụba a sị na Gọọmenti Rivas tikpọrọ mere El Rufai jiri bulitekwa okwu ahụ ọzọ iji bọrọ ọbọ.

Mana Gọọmenti Rivas egosiwo ọhaneze na o nweghị ụlọ Alakụba ọbụla ya tikpọrọ.

El Rufai gaa n’ihu tikpọrọ ya bụ ụlọ ụka, Steeti ọzọ nọ na mpaghara Ndịda ala anyị nwere ike tikpọkwaa ụlọ Alakụba dịkwa na be ha. Etu ahụ, nsogbu arịzịa ibe ya elu

Leave a Reply

Your email address will not be published.