NDI NTOROBỊA AGBAWORO BOBRISKY ỤGBỌ NWA MKPI NA NAỊJIRIYA

Spread the love

… Bụrụ nwoke ma ọ bụ kwapụ na Naịjiriya 

Abụja: Otu ndị ntorobịa na Naịjiriya bụ National Youth Council of Nigeria (NYCN) agwala omekanwanyị Bobrisky ka ọ kwarapụọ na Naịjiriya ma ọ bụ ọ malite biwe ndụ ka nwoke, kwụsị ịkwalite akwamiko nwoke na nwoke ma ọ bụ nwanyị na nwanyị. 

Ndị ntorobịa a nyere ịdọ aka na ntị a ụbọchị Wenezdee, oge ha bịara ngagharị iwe megide Inwe Mmekọ nwoke na nwoke /nwanyị na nwanyị n’isi ụlọ ọrụ National Council for Arts and Culture(NCAC) n’Abụja.

Comrade Akoshile Muktar,Osote Onyeisi otu NYCN(Mpaghara Etiti Mgbago Ugwu) kwuru na ndị ntorobịa akwadoghi usoro obibi ndụ Bobrisky na ndị otu ya ma rịọọ NCAC, dịka otu na-echekwa omenala Naịjiriya ka ha nwee mkpebi banyere okwu ahụ.

Muktar kwuru sị: “Bobrisky jiri ọsọ gbapụ n’obodo a maka ọdịmma ya ma ọ bụrụ na ọ gaghị esepu aka na ndụ ruru inyi nke akwamiko nwoke na nwoke/nwanyị na nwanyị nke megidere omenala anyị.

“NYCN hụtara ‘ndi otu Bobrisky’ dịka ndị rụrụ arụ, na-asọ oyi ma megidekwa iwu Chineke nakwa iwu obodo.

“Naịjiriya abụghị ebe ha ga- anọ na apịtọ udiri ihe a, anyị na ha ga-achịpụ ya. Anyị na-akpọkukwa Onyeisi ndị Uwe Ojii ala Naịjiriya nakwa Onyeisi ụlọ ọrụ nchekwa DSS ga ha nwuchikọọ Bobrisky ozigbo.

Otunba Segun Runsewe, Onye Nlekọta ukwu nke NCAC,onye nabatara ndị ntorobịa ahụ, kelere ha maka ịkata obi were pụta katọọ ajọ akparamagwa nke Bobrisky na ndị otu ya. 

O kwukwara na ụlọ ọrụ ahụ nke ọ nọ n’isi ya amaliteworii ibuso Bobrisky na ndị otu ya agha maka ‘usoro obibi ndụ na-eduhie ụzọ ma megidekwa omenala Naịjiriya’.

Leave a Reply

Your email address will not be published.