ENUGWU:NWATAKỊRỊ ATỌGBUWO NWATAKỊRỊ IBE YA

Spread the love

Enugwu: Nnukwu ọdachi dapụtara n’Enugwu oge otu obere nwa nwoke, Gọdwin Akpan dị afọ iri n’atọ tọgburu nwa nwoke ọzọ,Essien Nseobong dị afọ iri n’anọ ma kwanye ya n’ime mmiri ala.

Nkea mere n’abalị mbụ nke ọnwa Septemba n’Ugbo Lọrịns bụ ógbè ndị o nweghị ka ọ ha dị na ngwụcha Edmọnd Crescent (ebe ndị ọrụ nchekwa DSS nweburu ụlọ ọrụ n’Enugwu Steeti) na mpaghara Independence Layout. Ihe e jiri rụchaa ụlọ alawa aghara dị ebe ahụ bụ gbam gbam.

N’ụbọchị ahụ bụ Fraịdee, nwatakịrị ogbu ọchụ ahụ bụ Gọdwin raara nwatakịrị ibe ya ya na ya na-ese okwu sị ya ka ha gaa na mmiri ala nọ nso ebe ahụ gaa lụọ ọgụ.

Essien kwetere soro ya, ha na ụmụaka ndị ọzọ agawa ịlụ ọgụ n’ikpere mmiri Ekulu dịdebere ebe ahụ.

Kaosiladi, Essien amaghị na ụmụaka ndị ọzọ buru ya ihe ọzọ n’obi. Ka ha abụọ lụwara ọgụ, Gọdwin were ihe kụọ ya n’isi ma chịrị aka abụọ tọdo ya n’akpịrị.

Ụmụaka ndị ọzọ nọ na-ekiri, o were tọgbuo ya ma kwanye ya na mmiri ahụ ka ọ dị ka mmiri eriri ya.

Ozigbo ahụ  Gọdwin gbalagara, ruo taa. Otu onye n’ime ụmụaka ahụ, onye obi akaghị ịgbachite nkịtị pụtaziri tikuo ụmụ okorobịa nọ n’ọhịa na-ese ihe.

Ha gbatazịrị buga nwatakịrị ahụ ụlọ ọgwụ ebe dibịa bekee kwupụtara na ọ nwụọlarịị. Ọ gwakwara ha na ọ bụ ntọgbu ka a tọgburu nwatakịrị ahụ maka na afọ ya ekoghi eko ka onye mmiri riri. Kama, ọbara si ya n’imi n’ọnụ na-apụta.

Nwatakịrị nwoke a lara mmụọ bụ Gọdwin kwesịrị ịbanye JS2 n’ụlọ akwụkwọ Independence Layout Day Secondary School ugbua akwụkwọ bidoro ebe Essien, onye gburu ya kwesịrị ịbanye JS1.

Ọzọkwa, ha abụọ bụ ndị Akwa Ịbọm Steeti. Nna Gọdwin na-eche nche n’Emene ebe nna Essien na-ese foto n’ahịa Artisan Ọhụrụ.

Kaọdịtaa, okwu ahụ erubeghị ndị Uwe Ojii ntị. Mazị Nseobong, nna Gọdwin lawara be ha n’Akwa Ịbọm ịga jiri ụzọ omenala bọrọ ọbọ maka ọnwụ nwa ya nwoke.

Nsogbu dịkwa, ụmụaka bido ugbua kwawa arụ,  kedu ihe ha ga-abụ n’ọdịnihu?

Leave a Reply

Your email address will not be published.