ETIELA ỤKỌCHUKWU SI N’ỊCHỤ NWA AGBỌGHỌ AJỌ MMỤỌ BANYE IDINA YA N’IKE GWOO GWOO

Spread the love

Legọs –A kụwo otu ụkọchukwu chọrọ ịma nwanyị elu n’ike gwoo gwoo n’Ejigbo  Legọs.

Ya bụ ụkọchukwu, Daniel David bịara ịchụ nwa agbọghọ aha ya Happiness ajọ mmụọ tupu o siri nkute ụtaba banyezie ime ahịa. 

Ndị Uwe Ojii zọpụtara ya bụ ụkọchukwu dị iri afọ anọ n’aka ndị agbata obi nwa agbọghọ ahụ ka ha na-akụ ya ka ha kụgbuo.

Ụkọchukwu ahụ nọ n’ekpere mana ka ọ hụzịrị ara nwa agbọghọ ahụ bu n’obi, mmụọ akwamiko baa ya isi. O sizi n’ịsụ n’ire were metụwa onwe ya aka n’ahụ nwoke ya nke keliziri.

Ihe a mere na Ailegun Road, Bucknor Estate, mpaghara Ejigbo Legọs, ebe nwa agbọghọ ahụ bi ma na-azụkwa ahịa.

Ọ sị na ya nọ n’ụlọ ahịa ya, ụkọchukwu ahụ bịa buoro ya amụma banyere ezinụlọ nakwa ndụ ya nke yiri eziokwu. Ụkọchukwu ahụ sịrị na ya kwesịrị ịbịa jiri ude nso(olive) gọzie ụlọ ebe o bi ebe ọ ka kwatara ọhụrụ.

Happiness sị na ka ha batazịrị n’ime ụlọ ndina ya na nwoke ahụ chọzịrị ite ya ude nsọ n’ahụ nwanyị ya. Oge ọ jụrụ, ụkọchukwu ahụ gwazịrị ya ka o kulie chee ihe n’akwụkwọ nsọ.

Ọ gafeziri ya n’azụ ka ọ nọ n’ekpere ma jiri ọnụ ya na-emegharịzị ike nwa agbọghọ ahụ.

“Ọ sị m jidesie akwa m ike ka ike m were gosipụta ọfụma. Ka ọ nọ na-asụ n’ire, e lere m anya n’azụ hụzịa ka ọ na-apịzị onwe ya aka n’ahụ nwoke ya” 

Oge ọ chọzịrị idina nwa agbọghọ ahụ n’ike, o tiziri mkpu agbata obi were gbakọọ.

Happiness sị na ihe kacha wute ya bụ ego ọ napụrụ ya, ọ kpọrọ ego Ịkụ mkpụrụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.