NDIGBO BU IME UDO NA NAỊJIRIYA N’ISI – IBB

Spread the love

Site n’aka Sabastin Nwogwugwu-ọgwụ, Mịna

Mịna: Onye bụbu Onyeisiala Naịjiriya n’ọchịchị ndị soja, Ọchịagha Ibrahim Badamasi Babangida, akpọ̀ọla òkù , maka mkpa ọ dị, ịkwalite ezi adị m na mma, n’etiti ụmụ Igbo na Ndị agbụrụ ọzọ dị iche iche enwere na ala anyị bụ Naịjiriya.

Ọ bụ ụnyaahụ bụ Satọdee, ka ya bụ odogwu nwoke nọrọ wee kwuo nkea, n’ogige be ya dị na Hịltọ́p, nke dị na Mịna, Naịja Steeti oge ndị otú jikọrọ ụmụ Igbo ndị bi na steeti iri n’itoolu enwere n’Ugwu Awụsa bụ Igbo Delegates Assembly (IDA) bịara kpọtụrụ ya.

N’okwu ya, ka Babangida nọrọ, wee kwuo mkpa ọ dị ụmụ Igbo ikwado ezi mmekọ n’etiti ha na ndị ọzọ na ala anyị, ọ kachasị ndị nke bi n’ugwu awụsa, maka na ọ ga- eme ka ihe wee na agara onye ọbụna ọfụma.

Ọ kọwakwara onwe ya dịka ọgọ nakwa ezigbo enyi Ndigbo, bụ ndị ọ sịrị na à mà ama dịka ndị bu ime udo na Naịjiriya n’isi. Ọ rịọrọ ka Ndigbo jiri mụọ nke ịgba mbọ ha na mụọ ime udo were kwalite adimnotu nke ala anyị bụ Naijiriya.

N’okwu, Onyeisi IDA, Ichie Chikezie Okezie  kelere ya bụ nwoke maka mbọ ọ gbara, ihụ́ na Ndigbo so n’ihe a na-eme n’ala anyị, oge ọ nọ n’ọchịchị, bụkwa nke ọ sịrị pụtara ìhè, site na onyinye steeti abụọ o nyere Ndigbo.

Mazi Chikezie kelekwara Chineke n’isi ya bụ nwoke, maka inye ya ndụ, nke o ji wee merube emume ọgbụgba afọ iri asaa na asatọ nke o mere n’ izuka ole na ole gara aga.

Na mbido, Eze Ndigbo na Mịna, Eze Pampas Ngọzi Nwahiwe nọrọ wee kwuo, na ihe kpatara ọbịbịa ha bụ maka ikele Chukwu n’isi ya bụ nwoke, tinyekwuoro ekele banyere ọrụ ya n’ikwalite ezi adịm na mma n’ etiti ndị Igbo na Mịna na ndị ùgwù bụ ndị ha bi na be ha.

N’oge ọ na àgwà ndị nta akụkọ okwu, ka onye bụ ọnụ na-ekwuru otu Igbo Delegates Assembly (IDA), Mazi Emeka Udibe nọrọ, wee kpọkuo ụmụ Igbo nile maka uru ọ ga-aba ịkwalite udo na idiko n’otu, na ebe ọbụla ha nọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.