BUHARỊ AZỌPỤTALA KEYAMO N’AKA AKPABIO

Spread the love

Abụja: Onyeisiala Muhammadu Buhari azọpụtala Mazị Festus Keyamo bụbu Mịnịsta nta na-ahụ maka Mpaghara Naịja Delta na arịrị ọ na-eri site na ịrụ ọrụ n’okpuru Sinetọ Godswil Akpabio bụ Mịnịsta na-ahụ maka Mpaghara Naịja Delta site na iwegazị ya na mịnịstrị na-ahụ maka Ọrụ. 

Tupu ugbua, Keyamo, dịka Ọkaiwu ndị ụlọ ọrụ EFCC chọburu ịtụ Akpabio nga maka ebubo iri ngar ijeri pụrụ ijeri Naịra oge ọ bụ Gọvanọ Ákwá Ịbọm Steeti.

Kaosiladi, ụwa tụgharịrị, Keyamo were bụrụ Mịnịsta nọ n’okpuru Akpabio dịka nna ya ukwu na mịnịstrị na-ahụ maka okwu Naịja Delta.

Ozi anyị nwetara gosiri na obi koro Keyamo n’elu meziri o jiri gbagharịwa, rịọwa Abba Kyari, Onowu Onyeisiala Buhari ka ọ tọọ ya n’agbụ.

Ụta adịghịrị Keyamo maka na Akpabio adịla njikere izi ya ‘ihe ọkụ ji ntị oke eme’.

Site n’ozi si n’aka Onye Nlekọta Mgbasa ozi n’ụlọ ọrụ Odeakwụkwọ Ukwu Ala anyị, Wili Bassey, Keyamo nọchiziri Tayo Alasoadura dịka Mịnịsta nta na-ahụ maka ọrụ 

Chaị! Onye rịọrọ Buhari ka o gboo ọgụ dike abụọ a na-akwado ịgba mgba?

Leave a Reply

Your email address will not be published.