NWOKE ASUGBUOLA MA GBAA ONYE BỊARA IDINA NWUNYE YA OSE

Spread the love

Wọrị: Mazị Pịọs Ukrakpọ abụrụla onye kwere ukwu nwunye mmadụ were nwụọ ajọ ọnwụ.

Nwoke ọ na-esogharị nwunye ya n’ìkè jiri nwunye ya gbaara ya ọ́nyà. Akwara dọọrọ nwoke a, o wee soro nwanyị batakwuo  n’ime ụlọ ndina ya na di ya.

Njinji a jiri ụnyahụ na Jeddo dị n’Okpuru Ọchịchị Okpe dị na Delta Steeti.

Oge ahụ, di nwanyị a na nwanne ya nwoke mapụtara n’ebe ha zoro onwe ha. Ka nwoke a bụ ‘akwara dọgbuo m’ bịara ịgba ọsọ, nwanyị ahụ kwachiri ụzọ.

Ụmụ nwoke abụọ ahụ kere nwoke agbụ, were mma opio(dagger) sụwachaa ya ahụ ma ma gbaa ya ose n’ọnya ndị ahụ ha supuchara ya n’ahụ.

N’agbanyeghị mkpu nwoke ahụ na-eti, ha jụrụ imere ya ebere. Tupu ndị agbata obi na-agbata, nwoke nwụnyụrụ anya.

Nwanyi ahụ a na-akpọ Mama Ejima gbalagara mana ndị agbata obi jidere ụmụ nwoke abụọ ahụ.

Chai, nwoke a bụkwanụ ezigbote onye ụwa ọjọọ. Nwanyị, ọ dịnaghịzị, a ma dulaa ya mụọ n’ike. 

Onome Onovwakpoyeya, Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii na Delta Steeti kọwara etu ya bụ nwoke si were aka banye n’ọnụ ọnwụ, oge o sooro nwunye mmadụ were gawa be dị ya.

 

1 Comment

  1. Ihe nke a dịkwa egwu.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.