2023:NAMADI SAMBO NA NDỊ APC NA-AKPAZI

Spread the love

Kaduna –Alahaji Namadi Sambo, onye jibu ọkwa Osote Onyeisiala ka a na-atụ anya na ọ ga-abanye otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC n’oge na-adịghị anya.

Sambo nọrọ ụbọchị Fraịdee na Kaduna were too Gọvanọ Steeti ahụ, Mallam Nasir El-Rufai maka ‘ọrụ ọma’ ya, ọ kacha ịrụtọpụ mbawanye usoro mmiri obodo Zarịya nke were iri afọ anọ n’abụọ.

Sambo kwuru nkea mgbe ọ bịara Gọvanọ El Rufai njem mkpọtụrụ n’obi Gọọmenti Steeti ahụ.

Usoro mmiri nke Sambo malitere oge ọ bụ Gọvanọ Kaduna Steeti ga-enye nde mmadụ abụọ mmiri ọṅụṅụ.

Sambo kwukwara sị: “Obi tọrọ ụtọ na-echetara mbọ m gbara banyere ọrụ usoro mmiri ahụ”

Ọ gakwara n’ihu too aka ọrụ Gọvanọ El Rufai nke ọ sịrị buliteziri ọnọdụ akụnụba Steeti ahụ.

Na nzaghachi, El-Rufai kelere Sambo maka ịmalite atụmatụ ihazigharị ọnọdụ Kaduna dịka obodo mepere emepe.

” Gịnwa bụ Gọvanọ ọkacha mma na Kaduna Steeti. Ndị ọzọ wetara nsogbu mana gịnwa wetara ọganihu.

“Ị gara Abidjan, Tunis na Jeddah iji  chọta ego maka Usoro Mmiri Zarịya, i mekwara ka Gọọmenti Etiti rụọ eje (dam) na Galma iji nweta mmiri maka usoro a.

Ọ bụghị sọọsọ na Sambo na El-Rufai na-atọzị n’udi pụrụ iche, o nwebeghi mgbe Sambo jiri katọọ arụ nile ọchịchị dị ugbua na-akpa,tumadi ka e si akpagbu nna ya ukwu n’oge gara aga bụ Jọnatan na nwunye.

O doro ewu n’ọkụkọ anya na El-Rufai na-akwadosi ike ịzọ ọkwa onyeisiala n’afọ 2023, n’agbanyeghị na ndị ugwu nọkwa n’ọkwa ugbua.

Sambo marakwa na ‘Ukwu na-aga wara wara, na anya ahụ wara wara na-ele ya’

Leave a Reply

Your email address will not be published.