ENUGWU:ỤLỌ ỤKA KATỌLIKI ‘NNE ENYEMAKA EBEEBE’ NEW HAVEN EMEWO ORIRI ONYE NSỌ HA

Spread the love

… Ha mekwara mmemme ndula ụkọchukwu pụrụ apụ ya na nnabata ụkọchukwu nọzị ugbua. 

Enugwu: Ụlọ ụka Katọliki Nne nke Enyemaka Ebeebe, New Haven, Enugwu nọrọ ụnyahụ rie oriri nke onye nsọ ụlọ ụka ahụ na-aza aha ya. 

Ha jikwa ohere ahụ mee mmemme idula ụkọchukwu ochie ha, Fada Klementị Okonkwọ tinyekwara ịnabata ụkọchukwu nọzị ugbua, Fada Kristova Okechukwu.

Iji gosipụta afọ ojuju ha maka ọrụ n’enweghị atụ Fada Okonkwọ bụ ụkọchukwu malitere ụlọ ụka tụụrụ, e chiri ya echichi dịka ‘Ofu nwa n’ime Jizọs’.

O yinyere uwe ndị Ichie ma kpurukwa okpu mmemme iji gosi na o chizuola.

Ndị egwu ịgba ndị eze nke ndị nna ụlọ ụka ahụ dugharịzị ‘Ofu nwa n’ime Jizọs’ oge e chichara echichi ahụ.

Onyeisi oche otu nhazi chịkọbara ya bụ mmemme, Ambassador Stanli Okorie kwupụtara ọrụ ọma ya bụ ụkọchukwu nọbu mbụ, ọ kacha ka o si wee jiri afọ abụọ rụpụtara ha agadaga ụlọ ụka.

O kwukwara na n’agbanyeghị na o tebeghị aka ọ bịara, na ụkọchukwu Okechukwu na-akpakwa ike dị egwu site na ịhụ na e nwetara ala ebe a ga-arụ ụlọ ebe obibi maka ụkọchukwu ụlọ ụka (parish house).

O kwuru na oge Fada ahụ na-apụ, na Chineke zara ha ekpere site na iweta oyiri ya, Ụkọchukwu Okechukwu, onye mekwara ka ihe na-aga nke ọma.

N’okwu ya, Fada Okonkwọ kelere ndị nile nyere ya aka n’ọrụ ya mgbe ọ nọ n’ụlọ ụka ahụ. Ọ kọwakwara na “ọ dị ya ka na nrọ” bụ ọrụ ọma nile Chineke jiri ya rụọ ebe ahụ, n’agbanyeghị na o nweghị ihe ọbụla dị mgbe ọ bịara.

Ụkọchukwu Okechukwu, ụkọchukwu nọzị n’ụlọ ụka ahụ kelekwara ụkọchukwu nke pụrụ apụ, onye e chikọrọ ha abụọ ụkọchukwu otu ụbọchị maka ọrụ n’enweghị atụ ọ rụrụ iji hiwe ụlọ ụka ahụ.

Onyeisi ndị na-agụ ihe ọgụgụ n’ụlọ ụka, Mazị Layinuus Okechi na ndị otu ya nọkwara oge ahụ were kpọpụta ọgbụgba okwe e meere ndị na-agụ ihe ọgụgụ n’ụlọ ụka ahụ.

Onye gbara onye nke mbụ bụ Nwa-ada Chidịmma Anịdịobi, onye nke abụọ bụ Nwa-ada Ijeọma Anịoko, ebe Ọkaiwu (Oriakụ) Lilian Ikwueze bụ onye nke atọ. 

Na mmechi, e nwezịrị oriri pụrụ iche n’ụlọ ezumezu Fada Klementị Okonkwọ bụ ụlọ ezumezu a gụrụ aha ụkọchukwu ahụ pụrụ apụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.