Bọkịna Faso: Fabrice Zango, nwa afọ Bọkịna Faso na-awụ ‘triple jump’, enwetala ebili dị ka ihe nrite maka ịbụ nwa amala mba ahụ onye mbụ na-eturu ugo n’Asọmmpi Ịgba ọsọ Mba Ụwa e mepụrụ na Doha mba, mba UAE.  Zango, onye nwetara onyinye nturu ugo ọla ọkụ (bronze) na yaRead More →

Legọs: Onyonyoo nwata nwanyị gba ọtọ kwụrụ n’etiti ụzọ na-atamu jupụtara n’amaozi mkpakọrita(social media) dị iche iche. Ozi hoo!haa!! nwetara na-akọwa na ụgbọala kwụsịrị nwanyị ahụ ebe ahụ ma gbapụ n’ike tupu ndị mmadụ aghọta ihe na-eme oge o ji ọkara gafee elekere ise nke mgbede n’ebe Ajah, Legọs. OnyeRead More →

Kaduna Steeti –Nwoke dị iri afọ atọ n’ise, Ibrahim Adamu, nọrọ ụnyahụ kpụpụ ọgọ ya nwoke nakwa ọgọ ya nwanyị ụlọikpe Sharịya na Magajin Gari Shari’a, Kaduna Steeti, maka ịkwagbunyere ya nwa ha nwanyị dị ime ka ọ lụọ.  Onye a wetara mkpesa n’ihu ụlọikpe, onye bi n’obodo nta Rijjana,gwaraRead More →

Legọs: Afenifere, otu jikọtara ndị Yoroba nile akọwaala dịka ihe ihere bụ ọgbụgba ama  si n’aka ada Mamman Daura bụ Fatimah, na ezinụlọ ha bi ebi n’ime Asọ Rọk, kemgbe ihe karịrị afọ atọ.  Afenifere kọwara na ọ dị mwute bụ etu onye achọpụtaghi n’ọkwa siri wee kechikọọ Onyeisiala maRead More →

Otu ihe mere e jiri sie ọnwụ ka ọchịchị gafee na Mpaghara Mgbago Ugwu Anambara n’afọ 2013 bụ maka na mpaghara ahụ bụ ebe kacha kpere azụ na mmepe, n’agbanyeghị na ọ bụ ya bụ “aka na-enye Steeti ahụ nri” E weere na ọ bụrụ na ọchịchị laa ebe ahụ,Read More →

Ọnịcha: Njinji jiri taa n’Upper Iweka, Ọnịcha oge otu ụgbọala bu mmanu ụgbọala(petrol) gbara ọkụ.  Site n’ozi hoo!haa!! nwetara, ọkụ ahụ bidoro mgbe ya bu ụgbọala zọhiere ụkwụ, oge ọ na-achọ ịla azụ were dabanyezia n’ọwa mmiri(gutter) dị n’ebe ahụ. Mmanụ o bu wufuziri were soro ọwa mmiri ahụ gbasasịaRead More →

Enugwu: Ndi Gọvanọ na ndị ndu ndị ọzọ nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nwere ọgbakọ ụnyahụ n’Obi Gọọmenti, Enugwu were kpebie ịga hụ Onyeisiala Muhammadu Buhari maka ọdịmma ndị mpaghara ahụ.N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ka e mechara ọgbakọ ahụ, Onyeisi oche ọgbakọ ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda (SouthRead More →

… Nkea bụ mbụ ọgbakọ a na-alọta Enugwu kemgbe Achebe hiwere otu ANA na Nsụka n’afọ 1981 Enugwu:Ndi Odeè si mba ụwa nile ga-ezukọta n’Enugwu Steeti, ebe a nọrọ mụọ otu jikọtara ndị Odeè na Naịjiriya bụ Association of Nigerian Authors (ANA), ka ọ gachara iri afọ atọ n’asatọ ochieRead More →

Ọnịcha: E jidela nwoke kere ekike ka ‘ndị Sista’ ụka Katọliki were zuru nwa mmadụ. Nke a mere n’ụbọchị Fraịdee n’Okpoko, ógbè  ndị Ogbenye n’Ọnịcha. Nwoke ahụ, ana achọpụtaghi aha ya, dịka akụkọ siri kọọ, banyere n’ụlọ ndị mmadụ, n’oge ehihie, ebe nile dara owu. N’ihi na e chere naRead More →

Ichie Frank Opigo, onye nyere mba Bịafra aha bụ onye Ịjọ, nwa-afọ Angiama nke nọ na Bayelsa Steeti taa. N’ụbọchị Satọdee, abalị iri abụọ n’asaa nke ọnwa Mee, afọ 1967, e nwere Ọgbakọ ndị nnọchiteanya agbụrụ nile nakwa ọnụmara nile nọ na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjiriya. Okwu a kpụ n’ọnụRead More →

Enugwu:. Ntachi Ọsa, ụlọ erimeri kacha ewu ewu n’Enugwu ka ụlọ ọrụ Gọọmenti steeti ahụ na-ahụ maka Mmepe Isiobodo Steeti ahụ bụ Enugu Capital Territory Development Authority (ECDA) mechiri ụnyahụ. Site na nchọpụta onye nta akụkọ anyị mere, a na-akọwa na ECDA mechiri ụlọ erimeri ahụ maka na ọ na-ebuteRead More →

Abuja – Mịnịsta na-ahụ maka Njem Ụgbọelu, Mazị Hadi Siria nọrọ ụbọchị Tọọzdee kwuo na ọdụ ụgbọelu  Mba Ụwa Akanụ Ibiam, Enugwu ga-eri ijeri Naịra Iri iji malitekwa ọrụ ọzọ. Siria kwuru nkea oge ọ na-agwa ndị Kọmitii na – ahụ maka njem ụgbọelu n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Nta Ala anyịRead More →

Akure: Bishọọpụ Matiu Hasan Kukah, Bishọọpụ ụka Katọliki na Dayọsisi Sokoto, nọrọ ụbọchị Fraịdee kwuo na o nweghị onyeisiala obodo ọbụla na mba ụwa nile dị efulefu n’itinye ikike ya n’ọrụ dịka nke Naịjiriya. Kukah kwuru na Onyeisiala Naịjiriya anaghị abanye n’okwa na ọ ma ọrụ ma ọ bụkwanụ naRead More →

Abụja: Kemgbe onyonyoo ebe Sinetọ Dino Melaye na-egbuchapụrụ Onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ bịara gụpụtachaa Usoro Mmefu Ego Naịjiriya n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Ala anyị, mkpu na-akpọzị n’ama ozi mmekọrịta dị iche iche. Ụwa na-ajụzị, “Dino, ọ bụzịkwa gịnwa? Keduzi mgbe ụtọ gị na Buhari bidoro?” Site n’onyonyoo a, mkparịta ụkaRead More →

Legọs: Junaid Mohammed, Onye Omebeiwu n’ọchịchị Shagarị ma bụrụkwa onye okwu ya na-ada gbowam nọrọ ụbọchị Tuuzdee were kwuo hoo!haa! na Ndigbo chọọ ha kewapụ bụrụzịa Biafra ma anaha ha ọkwa Onyeisiala n’afọ 2023, ma ọ kaa ha obi.  Ọ nyere ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si mpaghara Ọwuwa Anyanwụ ndụmọdụ kaRead More →

Ụmụahịa: Ndi gụrụ n’Ụlọ akwụkwọ Sekọndịrị nke Onye nsọ Antoni, Ọhafia, Abịa Steeti nọrọ n’abalị iri abụọ n’itolu, nke ọnwa Disemba afọ 2018 gbakọọ n’ogige ụlọ akwụkwọ ahụ were hiwe ọgbakọ ndị gụrụ akwụkwọ ebe ahụ (old boys Association) . Bishop Antoni Gogo Nwedo hiwere ya bụ ụlọakwụkwọ n’afọ 1985.Read More →

… E kulara ha ụmụ ha kuga ebe mmadụ amaghị  Owere: Otu Igbo National Congress (INC) ekwuola na ọtụtụ ụmụ nwanyị nọ na nga maka ikwado Biafra bụ ndị ndị ọrụ nchekwa ala Naịjiriya dinara n’ike ma tụwakwa ime. Nnukwu Onyeisi otu a, Kọmredi Chilos Godsent kwuru nkea n’izu garaRead More →