ASABA:ONYE UWE OJII AGBAGBUOLA NWANYỊ ONYE OTU YA

Spread the love

Asaba: Njinji jiri ụbọchị Satọdee, oge otu nwoke onye uwe ojii gbagbunyụrụ nwanyị onye uwe ojii ibe ya anya n’Asaba, Delta Steeti.

Nkea mere oge ndị Uwe ojii so ndị ụlọ ọrụ Mịnịstrị na-ahụ maka Gburugburu na steeti ahụ na-etikpọ ụlọ ndị n’ezihi ezi na mpaghara Bonsaac n’Asaba.

Nsogbu dapụtara mgbe ụmụ nwanyị ndị na-azụ ahịa ebe ahụ nọchiri ha ụzọ.

Otu onye nọ ebe ahụ kọwara na ka ha nụrụ ụda egbe ndị Uwe ojii ahụ, ndị ụmụ nwanyị ahụ wakporo ndị Uwe ojii ahụ mere mgbọ jiri tụzịa nwanyị onye uwe ojii n’azụ.

Onye uwe ojii ahụ gbagburu ibe ya nọzị n’ụlọ nga ndị Uwe ojii ugbua.

E bugara nwanyị onye uwe ojii ahụ n’ụlọ ọgwụ Federal Medical Centre, Asaba ebe e kwupụtara na ọ nwụọla.

Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na otu nwoke bụ Ichie Bidi “eteela o ji Emeka ụmụ nwanyị ndị ahịa ahụ ahụ ma chọkwaa ịchụpụ ha n’ala ha na-akwụ puku Naira abụọ kwa ọnwa.

“O butere ụgbọala ntikpọ ụlọ (bulldozer), ya na onyeisi uwe ojii n’ógbè ahụ were gbaa izu wee kpọta ndị Uwe ojii anọ maka itikpọ ọdụ ahịa ndị ahụ.

“Ka ha tikpọchara ebe ụmụ nwanyị ahụ si akpata ihe ha na-eri, nke na-anọchighi ụzọ ma ọ bụkwanụ ọwa mmiri ọbụla, ha siri ọnwụ na-aga etikpọkwu nke onye nwe ụlọ, ebe ọ sịrị na ntuzi aka itikpọ ọdụ ahịa ndị ahụ si n’aka Mịnịstrị Steeti ahụ na-ahụ maka Gburugburu”

Kọmishọna ndị Uwe Ojii na steeti ahụ, Adeyinka Adeleke, kọwara na ha na-eleba okwu ahụ anya.

N’okwu nke ya, Ichie Bidi kwuru na ndị Uwe Ojii akpụrụla ụmụ nwanyị iri maka ya bụ ihe.

Leave a Reply

Your email address will not be published.