KANO:NWATAKỊRỊ NWOKE AFỌ ASAA NNA YA WỤRỤ ỊGA, KWỤWA AGỤỤ AFỌ ATỌ ANWỤỌLA

Spread the love

Kano: Otu nwatakịrị nwoke dị afọ asaa nna ya wụrụ ịga ma na-akpọ agụụ kemgbe afọ atọ anwụọla n’Okpuru Ọchịchị Madubi na Kano Steeti.

Ozi ruru hoo!haa!! ntị bụ na Muhammad Ujujud, nna nwatakịrị ahụ wụrụ ya na nwanne ya nwanyị, Binta, ogologo oge ahụ tupu nke nwoke anwụọ ụbọchị Mọnde.

Ọ bụzi ndị ụlọ ọrụ National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons (NAPTIP) bụ ihe bịara zọpụta Binta, onye dị afọ iri n’abụọ site n’enyemaka ndị agbata obi.

Ndị agbata obi kọwara na ọ na-esi ike tupu Ujujud enye ụmụaka ahụ nri.

Kaosiladi, ebelebe gbukwasịrị ebelebe oge ajọ nna ahụ dapụkwuru nwụọ.

Ujujud, onye ya na ọrịa obi na-agbarị kemgbe, koropụrụ ka ndị NAPTIP kpọchiri ya. Ọ nwụkwara ka e bu ya gbaga ụlọ ọgwụ.

Onye Nchịkọta NAPTIP na Kano, Mazị Sheu Umar,onye kwuru na nkea mere n’ezie, sịrị na ụlọ ọrụ ha enwebeghi ike ịchọpụta ihe kpatara nwoke ahụ jiri wee chie ụmụ ya ọnụ n’ala otu ahụ. 

O kwukwara na nwoke Ujujud ma bụrụkwa nwunye nna nwatakịrị ahụ laworo mmụọ ekwebeghi ekwu ihe kpatara o ji nọrọ di ya were agụụ n’arụrụala dulaa nwa nwunye dị ya mmụọ.

Hmm, aka nwanyị a adịghị ọcha banyere arụ di ya kpara

Leave a Reply

Your email address will not be published.