ANỤ NAMA NA-EBUTE ỌRỊA OBI-DỌKỊNTA NJỌKỤ

Spread the love

… Anụ nchi ka mma

Enugwu: A nọrọ ụbọchị Satọdee, abalị ise nke ọnwa Ọktoba were merube mmemme Ụbọchị Ncheta Obi(World Heart Day) n’ahịa New Haven, Enugwu. 

Abalị iri abụọ n’itolu nke afọ ọbụla ka otu mba ụwa wepụtara dịka Ụbọchị Ncheta Obi. Kaosiladi, abalị iri abụọ n’itolu nke afọ a danyere n’ụbọchị ụka meziri e jiri bugharịa tinye ya ụbọchị ndị ahịa nwere ọgbakọ

Ndị chịkọbara nkea bụ Kọmitii na-ahụ maka Ibusa ozi ahụike (medical out reach committee) nke ogige Nigerian Cardiothoraxic Centre of Excellence, n’ụlọ ọgwụ UNTH, Ituku-Ọzala, Enugwu.

N’okwu ya, Onyeisi oche otu Kọmitii ahụ, Dọkịnta Paskal Njọkụ, dibịa okachara maka ọrịa obi.

“Anyị bịara ime ka ndị mmadụ mata maka ọrịa obi, nsogbu na-eso ya, ụzọ esi egbochi ya nakwa udiri ndụ mmadụ gana-ebi iji gbalahụ ọrịa obi.

Ọ kọwakwara na e nwere udiri nri nakwa ihe ọṅụṅụ ndị mmadụ kwesịrị izere iji gbalahụ ọrịa obi.

” Ọtụtụ ihe eji eme ka nri tọọ ụtọ (seasoning) pụtara ugbua, nnu karịrị n’ime ha. Nkea sokwa ebute ọrịa obi.

” Ọzọkwa, onye ọbụla chọrọ ịgbalahụ ọrịa obi kwesịrị ịgbara oke ịta anụ ọsọ. Ọ kacha anụ ehi, ma uru anụ, ma afọ anụ. Ihe dị ka nchi nakwa anụ ọhịa ndị ọzọ ka mma karịa anụ ehi. Nchi na-agba ọsọ, na-agagharị. N’ihi ya, ọ naghị enweru abụba ka anụ ehi”

Dọkịnta Njọkụ kwuru na ajọ mmanụ bụ kolestrol na-ebute ọrịa obi karịrị akarị n’anụ ehi.

Ọ kọwakwara na anụ ọkụkọ ka mma mana azụ kacha enye ihe na-ahụ.

Ọ dọkwara ụmụ nwoke aka ná ntị maka ịṅụbiga mmanya oke maka na ọ na-eso akpalite ọrịa obi. 

Ihe e megasịrị n’oge ahụ gụnyere; Inye nkuzi, ilele ndị mmadụ ahụ, inye ndị mmadụ ọgwụ nakwa inye ndụmọdụ ahụike.

Hmm, ọ pụtara na o nweghị uru ọbụla dị na nama , n’agbanyeghị na ndị Fulani ji ya achọ ndị ha ga-egbu.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.