“BUHARỊ, KWUO OKWU MAKA Ọ́KWỤ̀ AKA GỊ E JIDERE N’ỌDỤ ỤGBỌELU HEATHROW MAKA IBUPU EGO” -PDP

Spread the love

Abụja: Otu ndọrọndọrọ ọchịchị  Peoples Democratic Party (PDP),nọrọ ụbọchị Satọdee, were  cheere Onyeisiala Muhammadu Buhari aka mgba itinye ọnụ n’okwu banyere Nasir Danu,ọ́kwụ̀ aka ya(close confidant) a nwuchikọrọ n’ọdụ ụgbọelu Heathrow na mba Briteenụ maka ibupu ego nakwa ịrụ akpụrụka akwụkwọ ejirimara (passport scam). 

PDP sịrị na nkịtị Ụlọ ọrụ Onyeisiala gbara kemgbe okwu ahụ dapụtara gosiri n’aka Buhari adịghị ọcha, ọ kachakwu ebe nwa amadị ahụ tụrụ ndị gbara onyeisiala gburugburu aka na nkwupụta ya.

Ha gakwara n’ihu gwa Onyeisiala Buhari ka o chefuo maka ikpuchi ya bụ akụkọ ọjọọ ebe ụmụ Naịjiriya nụworo ya ma na-echezi ka ụlọ ọrụ EFCC malite ime nnyocha banyere ya iji gbaa ndị nile aka ha dị na ya n’anwụ.

N’okwu ya, Ode akwụkwọ mgbasa ozi PDP, Mazị Kunle Ologbodiyan kwukwara na nkea gosiri na Gọọmenti Buhari, nke na-eti mkpu maka ibu agha megide iri ngarị bụ nke rere ere maka ngarị kwọ nwa n’azụ na-aga n’ihu n’ime ya.

PDP bokwara nwoke ahụ ebubo ịbụ onye e si n’aka ya eme mpụ ọrụ ngo ruru ijeri pụrụ ijeri Naịra n’Ụlọakụ Etiti Naịjiriya (CBN), Ụlọ ọrụ Mmanụ Agbidi (NNPC), wdg.

Kaọdịtaa, otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC ekwebeghi etinye ọnụ na ya bụ okwu. Kaosiladi, otu ihe doro anya bụ na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị anyị egbuola anyị egbu. N’agbanyeghị aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị ha, ma ọ bụ APC, PDP, APGA, wdg. Ha ma sọọsọ akpa ha.

Ya bụ iwepụ ndị a tinye ndị a n’enweghị Nhazigharị Usoro Ọchịchị (Restructuring) dịkwa ka mmadụ ire nkịta zụrụ enwe

Leave a Reply

Your email address will not be published.