LEGỌS:E JIDELA ONYE SI SAWỤT AFRỊKA GBALATA JI EGBE GAA OHI

Spread the love

Legọs: Ndi Uwe Ojii ọrụ aka ọkụ bụ Rapid Response Squad, RRS, ejidela ndị oji-egbe-ezu abụọ nke otu n’ime bụ onye ka si Sawụt Afrịka gbalata.

Mmadụ abụọ ahụ:Viktọ Remi, 27 na Eke Makswel, 23 ji egbe were zunahụ mmadụ ‘Apple laptop’ atọ ọnụ ahịa ya nọ na Otu Nde Naịra n’ọkara.

Ha dewere ahụ ka ndị isi ụlọ ọrụ chọrọ ịzụ laptop. Kaosiladi, oge e buteziri ha ahịa ahụ ha tụrụ, ha jiri egbe napụ ya onwe ahịa butere ha n’ike were gbalaga.

Remi, onye nke si Sawụt Afrịka gbalata bụ isi sekpụ ntị na nkata ha kpara were gaa ohi ahụ.

“A gwara onye ahịa ahụ na a bụ m onye nwe ụlọ ọrụ e mepere ọhụrụ na Acme Road, Ikeja. A tụrụ ahịa laptop abụọ, otu maka onwe m, nke ọzọ maka odeakwụkwọ ụlọ ọrụ m.

“Onye otu m, Makswel gbaziri ụgbọala Toyota Camry (FKJ 833 EZ) anyị jiri gaa ohi ahụ. Anyị zụtakwara egbe ụmụaka nke anyị tegharịrị uhie (re-painted). A gwara m onye ahịa ahụ ka o zute anyị na Acme Crescent maka na ebe ahụ na-ada owu.

Mmadụ abụọ ahụ bi na 18, Alexandra Street, Abule Egba, Legọs, sịrị na siri na matara ihe nile banyere onye ahịa ahụ site n’amaozi Twitter ya.

O kwuru na ọ bụ Makswel nya ụgbọala ebe ya onwe ya nọ n’azụ ụgbọala were tudozia nwoke ahụ egbe n’olu.

Ha napụrụ ya ngwa ahịa ya o wetara ha, chụtuo ya n’ụgbọala ma gbalaga.

Makswel mechara chọpụta na Remi tụụrụ ya asị. Laptop ndị ahụ dị atọ, o rere ha Narị puku Naịra ise mana ọ gwara onye otu ya na ọ dị abụọ, o ree ha Narị puku Naịra abụọ n’iri ise.

Onye ahịa, onye na-achọghị ikwu aha ya kọrọ ka ya na ihe siri gaa

“Mụ na Remi na-akpa na whatsapp. A maghị m na ha bụ ndị ohi. Ha ji egbe were napụ m laptop atọ ọnụ ahịa ha bụ otu nde Naịra n’ọkara” 

Kọmishọna ndị Uwe Ojii na Legọs Steeti, CP Zubairu Muazu nọrọ n’okwu ya were dọọ ọhaneze aka ná ntị ka ha belata udiri ozi ha na-etinye banyere onwe ha n’amaozi mkpakọrịta (social media) dị iche iche.

Egwu dịkwa! E kwuru ekwu na e kwesịrị ilebara ndị a si Sawụt Afrịka gbalata anya nke ọma. O sulanụ!

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.