BOKO HARAM:BORONU STEETI EGOBIWO NDỊ AGHA EKPERE ALAKỤBA

Spread the love

Meiduguri: Gọvanọ Babagana Zulum nke  Boronu Steeti nọrọ ụbọchị Fraịdee were tinye aka n’akwụkwọ mkpebi dị n’etiti ya na ndị ụkọchukwu Alakụba mmadụ iri atọ ndị bi na Makka, obodo e nwere ụlọ ekpere Alakụba kacha dị nsọ, ka ha malite ekpere agwụ agwụ iji meri Boko Haram were weghachi udo na steeti ahụ.

Onyeisiala Muhammadu Buhari gwara ndị Naịjiriya na ọchịchị ya egbujiela ndị Boko Haram aka n’ụkwụ. Mana ndị oyi ọha egwu a ka na – akpa ike dị egwu. Keduzi nke bụ eziokwu?

Isa Gusau, ọnụ na-ekwuru Gọvanọ ahụ kọwara na ndị ụkọchukwu Alakụba ahụ nile bụ ụmụ afọ Naịjiriya si Borono, Katsina, Zamfara, Kano nakwa Steeti ndị ọzọ n’ugwu Awụsa, ndị biworo ọtụtụ afọ na Makka, ebe ha nọgidere n’ekpere na Ka’aba.

“Otu onye n’ime ha bụ agadi nwoke, onye nọgideworo n’ekpere na Ka’aba afọ iri anọ.”

Chetakwa na Onyeisi Ọchịagha ndị agha ala Naịjiriya, Tukur Buratai sịzị na ọ bụ ekpere ka a ga-eji merie ndị Boko Haram.

Nkea pụtara na ike ọgụ ahụ agwụla ya. Kaosiladi, nwamadị ahụ ike ọgụ gwuworo, onye nke kwesịrị ịla ezumike nka kemgbe afọ abụọ gara aga ka bụkwa ọchịagha du ndị agha Naịjiriya aga ọgụ Boko Haram.

Keduzi ka a ga-esi nwee mmeri?

Ọzọkwa, ghọrọ ụmụ ụmụ gbuo ịchị ghọrọ ụmụ ụmụ chie ọzọ ajọka. O ruo na nke ndị Boko Haram, ndị ogbu ara ọbara, e jiri ekpere.

O ruzie na nke ndị Biafra, ndị gba aka arị ọjị, e were egbe dulaga ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published.