BỊAFRA:ỌTỤTỤ ỤMỤ NWANYỊ BỊAFRA NỌ NA NGA KA E DINARA N’IKE, TỤWAKWA IME-INC

Spread the love

… E kulara ha ụmụ ha kuga ebe mmadụ amaghị 

Owere: Otu Igbo National Congress (INC) ekwuola na ọtụtụ ụmụ nwanyị nọ na nga maka ikwado Biafra bụ ndị ndị ọrụ nchekwa ala Naịjiriya dinara n’ike ma tụwakwa ime.

Nnukwu Onyeisi otu a, Kọmredi Chilos Godsent kwuru nkea n’izu gara aga n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n’Owere n’izu ụka gara aga. 

“Site na nnyocha otu INC mere, ọtụtụ ụmụ nwanyị ndị a amụwo nwa, a kpọrọ ụmụ ha kpọga ebe mmadụ amaghị.

“E dinakwara ọtụtụ ha n’ike ka ha nọ na nga. Ihe kacha mwute bụ na o nweghị arụ ọbụla ha mere na abụghị na ha na-akwado nnwere  onwe Biafra”.

Chilos kwukwara na ha chọpụtara na ndị nkwado Biafra ruru mmadụ puku iri atọ nọ n’ụlọ nga dị iche iche na Naịjiriya n’ụzọ n’ekepeghi ha ikpe.

“Ụfọdụ n’ime ha ka e nye woro ntaramahụhụ nke mmụọ, nke ụbụrụ nakwa nke echiche. Ọtụtụ ụmụ nwanyị n’ime ha ka ndị ji ha na-edina n’ike kwa mgba kwa mgbe ebe ọtụtụ ụmụ nwoke n’ime nwụworo n’ime nga”

INC katọkwara Gọọmenti Buhari maka akparamagwa mmegide na m enyere nke mere e ji atọhapụ ndị Boko Haram na ndị nchị ndi Fulani na-akwafu ọbara ma were aka ike na-apịgbu ndị nkwado Biafra, ndị gba aka achọ nnwere onwe Biafra.

Otu INC gakwara n’ihu gwa Gọọmenti Etiti ka ọ tọhapụ ndị ndị nkwado Biafra nile nọ na nga tupu ngwụcha ọnwa Ọktoba afọ 2019.

Kaosiladi, otu INC ekwughizi ihe ga-eme ma Gọọmenti Etiti kpọọ ekwo nkụ, jụ ịtọhapụ ndị nkwado Biafra ndị a

Leave a Reply

Your email address will not be published.