EHIWELA OTU NDỊ GỤRỤ AKWỤKWỌ N’ỤLỌ AKWỤKWỌ SEKỌNDỊRỊ ONYE NSỌ ANTONI, ỌHAFIA

Spread the love

Ụmụahịa: Ndi gụrụ n’Ụlọ akwụkwọ Sekọndịrị nke Onye nsọ Antoni, Ọhafia, Abịa Steeti nọrọ n’abalị iri abụọ n’itolu, nke ọnwa Disemba afọ 2018 gbakọọ n’ogige ụlọ akwụkwọ ahụ were hiwe ọgbakọ ndị gụrụ akwụkwọ ebe ahụ (old boys Association) .

Bishop Antoni Gogo Nwedo hiwere ya bụ ụlọakwụkwọ n’afọ 1985. Ụlọ akwụkwọ ahụ azụpụtawokwa ọtụtụ ndị nwere agba n’obodo dịka Hon Ifeanyi Uchendu, Osote Ọnụ na-ekwuru Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Abia Steeti,Hon Joe Nkoro, Onye zọburu ọkwa Gọvanọ n’Abia Steeti, Fada(Dọkịnta) Ọgọstin Obi, Ọstrelia, Captain Kristịan Wammah,

N’okwu ya n’oge ahụ Ụkọchukwu Juud Njoku kelere ndị a gụburu n’ụlọ akwụkwọ ahụ maka icheta ụlọ akwụkwọ bụ ebe ha siri rịgoro were bụrụ mmadụ

“A na m ekele unu bụ ndị gụrụ n’Ụlọ akwụkwọ a, ndị hụtara ya dịka ihe dị mkpa bụ ịkwalite ụlọ akwụkwọ a bụ ebe unu siri rịgoro were bụrụ ihe ọbụla unu bụ taa n’ụwa

” Dịka onyeisi ụlọ akwụkwọ Sekọndịrị Onye dị nsọ Antoni, Ọhafia, a ga m enye unu nkwado zuru oke ma wakwaa unu ajị n’ime iji hụ na ebumnuche unu jiri hiwe otu a ga-abịa na mmezi”.

Ihe ndị e megasịrị n’oge ahụ gụnyere ; iwepụta iwu na-achị otu ahụ, ịhọpụta ndị isi nakwa Ịkụ ngaji n’eze.

Ndị a họpụtara dịka ndi isi otu a gụnyere: Hon Jọn Njọkụ, Onyeisi, Ichie Jọn Ụba, Osote Onyeisi,Ichie Emeka Chinweokwu, Odeakwụkwọ tinyere ndụ ọzọ.

Oge ọ na-ekele ndị otu ahụ, Onyeisi otu ahụ a họpụtara ọhụrụ, Ichie Jọn Njọkụ kelere ndị otu ya maka inwe ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ.

“E ji m obi ụtọ a nabata ọkwa a ma na-ekelekwa unu maka ntụkwasị obi unu nwere n’ebe nọ.

“Site na nkwado unu, anyị ga-agba ịkwalite ụlọ akwụkwọ a nke zụpụtara anyị nile”

Ichie Njọkụ gụpụtara ihe ha bu n’obi ịrụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ dịka ịgba ụlọ akwụkwọ ahụ ogige gburugburu nakwa ịrụpụtara ha ụlọ nkà n’ụzụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.