BỊAFRA:NDIGBO, Ọ KAA UNU OBI, LAANỤ-JUNAID

Spread the love

Legọs: Junaid Mohammed, Onye Omebeiwu n’ọchịchị Shagarị ma bụrụkwa onye okwu ya na-ada gbowam nọrọ ụbọchị Tuuzdee were kwuo hoo!haa! na Ndigbo chọọ ha kewapụ bụrụzịa Biafra ma anaha ha ọkwa Onyeisiala n’afọ 2023, ma ọ kaa ha obi. 

Ọ nyere ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si mpaghara Ọwuwa Anyanwụ ndụmọdụ ka ha chefuo maka ịzọ ọkwa Onyeisiala n’afọ 2023.

Junaid, n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ kọwara na Ndigbo ewepụtabeghi onye tozuru ịchị Naịjiriya.

”A na m echere Ndigbo aka ka ha kewapụ ma anaha ha ọkwa Onyeisiala n’afọ 2023. Ha ekewapunwughi, ha gbakwaa ọkụ. Ha chọburu ikewapụ na mbụ mana e meriri ha, ihe karịrị otu nde mmadụ n’ime ha tufukwara ndụ ha”.

http://www.hoohaa.com.ng/2019/07/14/2023onye-ugwu-kaga-abukwa-onyeisiala-unongo/

“Ha chọọ ikewapụ ọzọ maka ndọrọndọrọ ọchịchị 2023, ha gaa n’ihu. O nwere onye na-arịọ ha biko? ”

Kaosiladi, Ichie Nnịa Nwodo, Nnukwu Onyeisi, Ọhaneze Ndigbo ekwuola na ihe kaara Ndigbo mma ha na-achọ ugbua abụghị ọkwa Onyeisiala

” Ihe ka Ndigbo mkpa ugbua abụghị ọkwa Onyeisialasi n’afọ 2023. Ihe dị anyị mkpa ugbua bụ Nhazigharị Usoro Ọchịchị Obodo (Restructuring).

“Ọhaneze Ndigbo na-agbasi mbọ ike ịhụ na anyị na ụmụ nwanne anyị, ndị Naịjiriya si mpaghara ndị ọzọ jikọrọ aka ọnụ mee nkea”

Nwodo kọwakwara na ọ bụrụ na e megharịghị Iwuala Naịjiriya nke afọ 1999, nke dị ire ugbua, na o nweghị ebe Naịjiriya ji azụ aga, ma onye Igbo achịrị ma onye Igbo achịghị.

Hmm, Ndigbo ka anyị were okwu mwamadị wee mata ihe ndị a buru anyị n’obi. Ịzọ ọkwa Onyeisiala ugbua ga-ebutekwa ndị Naịjirịa ndị ọzọ, ndị sozi anyị achụ ndị Fulani ịlaghachi azụ sorozịa ha chụwa anyị

Leave a Reply

Your email address will not be published.