HMM, BUHARỊ NA DINO? ỤWA NTỌỌ

Spread the love

Abụja: Kemgbe onyonyoo ebe Sinetọ Dino Melaye na-egbuchapụrụ Onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ bịara gụpụtachaa Usoro Mmefu Ego Naịjiriya n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Ala anyị, mkpu na-akpọzị n’ama ozi mmekọrịta dị iche iche.

Ụwa na-ajụzị, “Dino, ọ bụzịkwa gịnwa? Keduzi mgbe ụtọ gị na Buhari bidoro?”

Site n’onyonyoo a, mkparịta ụka n’etiti ndị iro abụọ a gara otu a:

Dino, “Onyeisi, a gị nwe aka a (Ranka dede, Baba)

Buhari,” Nwatakịrị a, ọ kwa ị sị na ị naghị anụ ntị ”

Dino,” Onyeisi, mbanụ. Ọ bụghị otu ahụ”

Dino wụzịrị ndị kwụ ya n’azụ na-ebuso Buhari n’ ala. Ọ sịghịdị ka ọ gwa ha na-egwu adagharịala. Keduzi maka ndị kworo ya merụọ ahụ ma ọ bụkwanụ tufuo ndụ ha?

Ụtọ ọhụrụ a malitere n’etiti ya na Buhari, ọ pụtara na Dino na-akwado igbaghachi n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC maka na o nwetaghi ikike iji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP were zọọ ọkwa gọvanọ na Kogi Steeti?

Onye a ghọrịrị ka a gbara. Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị anyị nile bụ otu ihe. APC na PDP, tinyekwara ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzọ, e nweghị ihe dị iche. Ụwa ntọọ!

Leave a Reply

Your email address will not be published.