O NWEGHỊ ONYEISIALA DỊ EFULEFU KA NKE NAỊJIRIYA – KUKAH

Spread the love

Akure: Bishọọpụ Matiu Hasan Kukah, Bishọọpụ ụka Katọliki na Dayọsisi Sokoto, nọrọ ụbọchị Fraịdee kwuo na o nweghị onyeisiala obodo ọbụla na mba ụwa nile dị efulefu n’itinye ikike ya n’ọrụ dịka nke Naịjiriya.

Kukah kwuru na Onyeisiala Naịjiriya anaghị abanye n’okwa na ọ ma ọrụ ma ọ bụkwanụ na o tozuru ịbụ onye ọchịchị kama ma ọ bụ site na ndapụta.

O kwuru nkea n’Akure, oge ọ na-enye nkuzi na mmemme Ulefunta/Oyemekun nke isiokwu ya, bụ “Ịtọ ntọala maka ezigbo obodo.” nke e mere n’ụlọ ezumezu Agumakwụkwọ Francis Idibiye na mahadum Federal University of Technology, Akure.

Kukah rụtụrụ aka na usoro e jiri hiwe ọkwa Onyeisiala Naịjiriya mere ka onye ọbụla ji ọkwa ahụ nwee ike dị oke egwu, nke na o nwere ike iji mee ihe masịrị ya.

O kwuru sị, “O nweghị onyeisiala ọbụla na mba ụwa nile nwere udiri ikike ọchịchị onyeisiala Naịjiriya nwere.

” N’ihi ya, o nweghị onyeisiala ọbụla dị efulefu ka nke Naịjiriya”

Bishọọpụ Kukah so na ndi na-akpọ oku maka Nhazigharị Usoro Ọchịchị Naịjiriya

Leave a Reply

Your email address will not be published.