BỊAFRA ECHEFUOLA OPIGO, ONYE ỊJỌ BARA YA AHA

Spread the love

Ichie Frank Opigo, onye nyere mba Bịafra aha bụ onye Ịjọ, nwa-afọ Angiama nke nọ na Bayelsa Steeti taa.

N’ụbọchị Satọdee, abalị iri abụọ n’asaa nke ọnwa Mee, afọ 1967, e nwere Ọgbakọ ndị nnọchiteanya agbụrụ nile nakwa ọnụmara nile nọ na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjiriya.

Okwu a kpụ n’ọnụ bụ Ihe a ga-eme banyere oke mkpagbu nakwa mkpochapụ agbụrụ nke ndị mpaghara ahụ na agabiga mgbe ahụ n’aka ndị Naịjirịa ndị ọzọ, ọ kacha ndị Ugwu.

Oge e kpebiri na mpaghara ahụ ga-ekewapụ ma nwee nnwere onwe, okwu ọzọ bụzi iwepụta aha ya bụ mba ọhụrụ ga-aza.

Frank Opigo nọrọ n’ọgbakọ ahụ kpọọ oku, nke n’enweghị mgbagha, ka aha mba ọhụrụ ahụ bụrụ BỊAFRA.

Opigo, onye e chiri echichi dịka Dawai nke atọ ma bụrụkwa Eze ọdịnala Amananaowei nke Angiama bụ nna ọchịchị obodo(elder statesman), onye nkwalite Agumakwụkwọ (educationist) nakwa omereọha(pilanthropist).

Opigo, onye pụtara na mahadum n’afọ 1953 dị ka onye Ịjọ mbụ gụrụ Mahadum ka e mere Onye Nlekọta mpaghara Yenagoa na Biafra tinyekwara Kọmishọna na-ahụ maka Mmepe Ime obodo n’afọ 1967.

Ebe o si weta aha ahụ bụ na Baịtị Biafra, nke agụgharịrị Baịtị  Bọnị, ka e meriri Bịafra n’agha.

Kaosiladi, alaeze Bịafra dịburii n’Afrịka tupu ndị ọcha abịa.

Eserese ala (map) mba Afrịka nke 1662 gosiri na e nwere alaeze atọ dị n’ebe mba Briteenụ siri kepụta obodo Naịjiriya.

Alaeze atọ ahụ bụ Bịafra, n’Ọwuwa Anyanwụ; Zamfara, na Mgbago Ugwu; tinyere Bini, n’Ọdida Anyanwụ. Alaeze Biafra ochie ahụ siri n’Ọwụwa Anyanwụ Naịjiriya gafee Kamerun, ma rutekwa mba Gabọn.

Opigo natara  nnukwu mkpagbu n’aka ndị be ha nakwa n’aka Gọọmenti Naịjiriya maka    nkwado o nyere Biafra.

Iji maa atụ, a naghara ihe nile rubere ya dịka nna ọchịchị. Nke ka nke, n’agbanyeghị na ọ bụ onye Ịjọ, e jiri usoro Alawa Aghara (Abandoned Property) nke Gọọmenti Naịjiriya wepụtara oge agha bere were napụ ya ala ya. Gọọmenti naara ya ụlọ akwụkwọ Niger Grammar School, D-Line, Igwe Ọcha bụ nke ya.

Ruo n’ọnwụ ya, n’afọ 2010, o nweghị mwute ọbụla banyere nkwado o nyere Biafra nakwa ịhụnanya o nwere ebe Ndigbo nọ.

Ọ dị oke mwute na ndị na-ekwu okwu nnwere onwe Bịafra taa echefuola ochie dike a, onye bara Bịafra aha, onye nke mbọ ọ gbara iji kwado Bịafra bụ adịghị nchefu.

Ma ndị MASSOB, ndị IPOB, o nwebeghi onye chetara ịkwanyere odogwu ahụ ugwu ruuru ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.