MGBAGWOJU ANYA DỊ N’ỌGBAKỌ MBAỤWA NDỊ ODEÈ GA-ENWE N’ENUGWU, GỌỌMENTI AGBASAPỤBEGHI AKA ILE ỌBỊA

Spread the love

… Nkea bụ mbụ ọgbakọ a na-alọta Enugwu kemgbe Achebe hiwere otu ANA na Nsụka n’afọ 1981

Enugwu:Ndi Odeè si mba ụwa nile ga-ezukọta n’Enugwu Steeti, ebe a nọrọ mụọ otu jikọtara ndị Odeè na Naịjiriya bụ Association of Nigerian Authors (ANA), ka ọ gachara iri afọ atọ n’asatọ ochie dike edemede Chịnụalụmọgụ Achebe na ndị otu jiri hiwe otu ahụ na Mahadum Naịjiriya, Nsụka. 

Ọkammụta Wole Soyinka, Ọkammụta Jọn Pepper Clark, Chika Unigwe, Odia Ofeimun tinyekwara ìgwè ụmụ Naịjiriya ndị ụwa maara aha ha ka a na-atụ anya ha n’Ọgbakọ Mbaụwa otu ANA nke iri atọ n’asatọ ga-adị n’Enugwu site na Tọọzdee, abalị iri atọ n’otu nke ọnwa Ọktoba ruo n’ụbọchị Satọdee, abalị abụọ nke ọnwa Nọvemba, afọ 2019.

Kaosiladi, e nwere ihe mgbagwoju anya na Gọọmenti steeti ahụ egosibeghi mmasị ziri ezi maka ịbụ ole ọbịa ya bụ oke mmemme, nke ngalaba otu ahụ n’Enugwu Steeti gbara mgba ka dike n’asa tupu o nweta ikike ibute ya n’Enugwu Steeti.

N’oge otu nhazi mmemme ahụ gwara ndị nta akụkọ okwu ụnyahụ, Onyeisi oche, ANA, Ngalaba Enugwu Steeti, Zulu Ọfọelue kwuru na ndị ọbịa ga-anọ Enugwu maka ya bụ ọgbakọ abalị atọ ga-eru mmadụ narị ise.

Ozi ya kwuru sị:”Ọgbakọ mbaụwa nke afọ abụ nke mbụ n’Enugwu kemgbe e hiwere otu ANA na Nsụka n’afọ 1981.

“Anyị kpọrọ ya  “Nlọta Ụlọ 2019″ n’ihi na otu a na-alọta ụlọ, ebe ọ malitere”.

Ọfọelue, nwere olileanya na Gọvanọ feanyichukwu Ugwuanyi, dịka Nnukwu Ole Ọbịa nke ọgbakọ ahụ ga-eji ohere ahụ were gosipụta ezigbo aka ọrụ Gọọmenti ya nye ìgwè mmadụ ndị ọnụ na-eru n’okwu ga-abịa ya bụ ọgbakọ.

http://www.hoohaa.com.ng/2019/06/30/ana-ehiwela-otu-nhazi-coal-city-homecoming-2019/

N’aka nke ọzọ,  Dọkịnta Greg Mbajiorgu, onye so n’otu nhazi mmemme ahụ ma bụrụkwa onye nkuzi na Ngalaba Ejije nke Mahadum Naịjiriya, Nsụka enweghị oke olileanya n’ihi na, dịka ọ kọwara, o nwebeghi Gọvanọ Enugwu Steeti gosiri mmasị n’ịbụ ole ọbịa mmemme ahụ ruo taa.

“O teela ANA nwere agụụ ịhụ na e nwere Ámá ndị Odeè (Writers’ Village) n’Enugwu, ebe a mụrụ ya. Ọzọkwa, Enugwu bụ isi obodo Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjiriya n’okwu banyere edemede nakwa iche echiche ntule(intellectualism).

“Ọ ga-adị mwute ma ezigbo gọvanọ anyị tufuo ohere a pụrụ iche nke isonye na mmemme a were mee ka aha ya bụrụ adịnchefu, site na inye nkwado zuru oke iji mee ọgbakọ etu kwesịrị ekwesị” .

Mbajiọgụ, onye a maara dịka “Nna Ejije Otú Onye na Naịjiriya” kwukwara na emeghị nke a ga-ebutere Gọọmenti nakwa ndị Enugwu  tinyekwara Ndigbo nile ajọ aha.

“Nke ahụ ga-abụ oke ọdachi, ma n’udịrị ndọrọndọrọ ọchịchị ma n’udịrị nile”

Ọkammụta Egya Sule nke si Mahadum IBB,  Lapai, Naịja Steeti ga-enye nkụzi nke gbadoro ụkwụ n’isi okwu ọgbakọ ahụ, “Edemede,  Mụọ ofufe ala anyị ya na okwu ịdịnotu” 

Ihe ndị a ga-emegasị na mmemme ahụ gụnyere; Emume Mmalite Ọgbakọ, Njem Nkiri Anya tinyere Abalị ihe ngosi omenala /Ejije Ọgbakọ nke ga-adị n’ụlọ ezumezu International Conference Centre, IMT, Enugwu n’ụbọchị Fraịdee, abalị mbụ nke ọnwa Nọvemba, afọ 2019.

Ọgbakọ Izugbe kwa afọ (AGM), ebe a ga-anọ were họpụta ndị isi ọchịchị ọhụrụ otu ANA n’ala anyị ga-adị n’ụbọchị Satọdee, abalị abụọ nke ọnwa Nọvemba, afọ 2019.

Leave a Reply

Your email address will not be published.