ỌDỤ ỤGBỌELU ENUGWU:NDỊ GỌVANỌ E NWEELA ỌGBAKỌ KA OTU IRF NYE CHARA NTIMIWU

Spread the love

Enugwu: Ndi Gọvanọ na ndị ndu ndị ọzọ nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nwere ọgbakọ ụnyahụ n’Obi Gọọmenti, Enugwu were kpebie ịga hụ Onyeisiala Muhammadu Buhari maka ọdịmma ndị mpaghara ahụ.N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ka e mechara ọgbakọ ahụ, Onyeisi oche ọgbakọ ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda (South East), Omenka Devid Ụmahị sịrị na ọ bụ oge ha batara ka ha ga-ekwụpụtara na ihe ha jetara.

Ndị ndu ndị ọzọ gụnyere Sinetọ Enyinnaya Abaribe, Ichie Nnia Nwodo, Sinetọ  Enyinnaya Abaribe, Sinetọ Viktọ Umeh, Sinetọ Jim Nwobodo, Aachịbishop Emmanuel Chukwuma nakwa Bishop Callistus Onaga.

Ọgbakọ mberede ahụ ha nwere bụ mgbe otu Igbo Renaissance Forum(IRF), otu na-ahụ maka ọdịmma Ndigbo, nyere ntimiwu ka ndị Gọvanọ ahụ nwee ọgbakọ iji kpebie etu ka mma isi hụ na a malitere ọrụ ndozi ọdụ ụgbọelu ahụ.

N’ozi nke Nze Ugo-Akpe Onwuka (Oyi of Oyi II),Onyeisi otu Igbo Renaissance Forum (IRF) tinyere aka, otu IRF kpọrọ ndị Gọvanọ ka ha nwee ọgbakọ ntụmadị maka okwu ọdụ ụgbọelu ahụ.

“Anyị na-akpọku ndị Gọvanọ Ala-Igbo ka ha kpọọ ọgbakọ ntụmadị iji kpebi otu a ga-esi rụpụta ọdụ ụgbọelu ahụ n’oge n’adịghị anya.

Ọzọkwa, Sinetọ Enyinnaya Abaribe kpọkukwara ndị Gọvanọ ka ha weta ego e ji aruzi ya bụ ọdụ ụgbọelu, iji belata ahụhụ ndị mpaghara ahụ na-ata, ebe Gọọmenti Etiti adịghị nkwadebe itinye ya ego.

Ọ tụzịrị n’anya na ndị Gọvanọ ekwuteghi banyere ọdụ ụgbọelu ahụ n’okwu ha gwara ndị nta akụkọ.

Kaosiladi, ozi anyị nwetara na-egosi na ọ bụ isi sekpụ ntị n’ọgbakọ ha na Onyeisiala na-akwado inwe ụbọchị Tọọzdee.

N’ihi ọkụ ọhaneze chara ha, ndị Gọvanọ a kpebiri ịhụ na Onyeisiala chọrọ ụzọ ọzọ isi weta ego maka ọrụ ahụ. Ma ọ gaghị, ha ga-atụkọtazị ego were ruo ya ma gbawazịa Gọọmenti Etiti ụgwọ ya.

Ozi IRF ahụ kwukwara sị:

“Anyị chọrọ ime ka ndị Igbo nile nọ n’ọkwa oge arụziburu ọdụ ụgbọelu ahụ na mbụ, ndị riri ngarị were rụọ ajọ ọrụ jikere ịgwa Ndigbo ka ha na ihe siri gaa maka na anyị ga-agbapụ ha afọ” 

Otu IRF kwara arịrị na ndị bụ Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu, oge a rụrụ ọrụ adigboroja n’idozi ya bụ ọdụ ụgbọelu bụ ụmụ afọ Igbo.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.