MAMMAN DAURA IBI N’ASỌ RỌK, NA-ALỤ BUHARỊ KA NWUNYE DỊ MWUTE-AFENIFERE

Spread the love

Legọs: Afenifere, otu jikọtara ndị Yoroba nile akọwaala dịka ihe ihere bụ ọgbụgba ama  si n’aka ada Mamman Daura bụ Fatimah, na ezinụlọ ha bi ebi n’ime Asọ Rọk, kemgbe ihe karịrị afọ atọ. 

Afenifere kọwara na ọ dị mwute bụ etu onye achọpụtaghi n’ọkwa siri wee kechikọọ Onyeisiala ma na alụzị ya ka nwanyị site na mkpughe nke si n’aka Nwunye Onyeisiala, Aisha Buhari.

Ọnụ na-ekwuru otu ahụ, Mazị Yinka Odumakin, kwupụtara nkea n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụbọchị Tuuzdee.

Odumakin kwuru sị, “Ọ dị mwute na Naịjiriya eruwo nke bụzi na onye enweghị ka e siri họpụta ya ma ọ bụkwanụ nwere ọkwa ọbụla a kpọlitere ya na ya nke dị n’usoro iwuala anyị bịazịrị nwee udiri ikike a.

“Ọ bụ nnukwu ihe ihere ma na ụfọdụ ndị ahụ nọ n’Asọ Rọk n’udịrị megidere iwu nọkwuzi ebe ahụ ndị nta akụkọ a na-agba ha ajụjụ ọnụ.”

O kwuru na o gosiri etu mpụ siri dịzịa elu n’ala anyị taa: “O gosiri na-emerụọla isi ọchịchị ala anyị, tinyekwara ala anyị n’onwe ya.

Odumakin sịrị na site na mkpughe a, ugo eberela na mgbagbu iji mata ma ndị ‘okenye arụrụ ala’ aga aga n’ihu isi n’azụ na-achị Naịjiriya ma ọ bụkwanụ na obodo a ga – apụ n’agbụ nwere onye ya. 

Fatimah, ada Mamman Daura jiri aka ya gbapuo nna ya afọ. Mamman Daura bụ isi sekpụ ntị na nsogbu Naịjiriya nwere taa. Ya bụ onyeisi ‘cabal’ ji Naịjiriya n’ala.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.