OBIANỌ EGBUWO ANAMBARA – ODUMODU

Spread the love

Otu ihe mere e jiri sie ọnwụ ka ọchịchị gafee na Mpaghara Mgbago Ugwu Anambara n’afọ 2013 bụ maka na mpaghara ahụ bụ ebe kacha kpere azụ na mmepe, n’agbanyeghị na ọ bụ ya bụ “aka na-enye Steeti ahụ nri”

E weere na ọ bụrụ na ọchịchị laa ebe ahụ, na ha ga-ejizi aka ha kwalite ọnọdụ mmepe ha.

Ọ dịzị mwute na Gọvanọ Wili Obiano, Akpọkuedike meziri ka ọnọdụ mpaghara ahụ kazịa njọ.

Ewezuga Aguleri,ebe ndị ọzọ n’Okpuru Ọchịchị  Ọwụwa Anyanwụ Anambara , Ọdịda Anyanwụ Anambara, Ayamelum nakwa ndị ọzọ tọrọ atọ ugbua.

Ebe o si ka njọ bụ na ọtụtụ ndị mpaghara ahụ, ndị Obianọ jiri inye ọkwa na Gọọmenti fachie ọnụ na-adakpo ndị be ha, oge ọbụla ha chọrọ ikwu pụta na ọ gbakụtara ha azụ.

Ndị a kwesịrị ịma na ọchịchị anaghị adịgide.

Ha nwere ike biri ebi n’ụlọ nkwari, n’obodo mepere emepe taa, mana ha ga alaghachigharịrị obodo n’enwebeghi mmepe ọbụla, ma si n’ọkwa rituo.

Onyonyoo dị n’akụkọ a bụ nke Ala na Onugwa dị n’Okpuru Ọchịchị Ọdịda Anyanwụ Anambara. 

E ji m n’aka na ‘mobile CCTV Cameras’ ga-aganwu udiri ebe ahụ iji jide ndị omekome?

Anambara tọrọ atọ!

Odumodu Gbulagu bi n’Ọnịcha 

Leave a Reply

Your email address will not be published.