ỌKỤ NA-AGBA N’UPPER IWEKA

Spread the love

Ọnịcha: Njinji jiri taa n’Upper Iweka, Ọnịcha oge otu ụgbọala bu mmanu ụgbọala(petrol) gbara ọkụ. 

Site n’ozi hoo!haa!! nwetara, ọkụ ahụ bidoro mgbe ya bu ụgbọala zọhiere ụkwụ, oge ọ na-achọ ịla azụ were dabanyezia n’ọwa mmiri(gutter) dị n’ebe ahụ.

Mmanụ o bu wufuziri were soro ọwa mmiri ahụ gbasasịa ebe nile. Etu ahụ ka ọkụ ahụ siri sorokwa ọkụ ahụ were gbasaa ebe nile.

Ọkụ sikwa otu ahụ were dara ngwa ahịa nakwa ụlọ ndị mmadụ were tarie.

Ndị mmadụ, dịka ha si eme oge ọbụla udiri ihe a mere, gbakọrọ na-ekwu ya bụ mmanụ ụgbọala kwafurunu tupu ọkụ were tanwuru.

Ihe funahụrụ ndị mmadụ n’ọdachi ọkụ ọgbụgba ahụ karịrị nde Naịra iri n’ise

Ozi anyị na-enweta ugbua bụ na ọkụ ahụ merụrụ ọtụtụ mmadụ ahụ ebe ọ gbapịara otu nwanyị na nwa ya nwoke, ndị so na-eku ya bụ mmanụ ụgbọala kwafuru akwafu. 

Kedụ ihe mere na ndị mmadụ agaghị amụta ihe chaa chaa? Ụgbọala mmanụ daa onye ọbụla nọ nso kwesịrị ịgbapụ ọsọ ndụ ozigbo, ọ bụghị ịbịa nọrọ kuwe ya bụ mmanụ kwafuru.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.