AKPỤNYELA ZANGO, NWA BỌKỊNA FASO BỤ ỌKAIBE ‘TRIPLE JUMP’ EBILI MAKA ỊGBATA ONYE NKE ATỌ NA MBA ỤWA

Spread the love

Bọkịna Faso: Fabrice Zango, nwa afọ Bọkịna Faso na-awụ ‘triple jump’, enwetala ebili dị ka ihe nrite maka ịbụ nwa amala mba ahụ onye mbụ na-eturu ugo n’Asọmmpi Ịgba ọsọ Mba Ụwa e mepụrụ na Doha mba, mba UAE. 

Zango, onye nwetara onyinye nturu ugo ọla ọkụ (bronze) na ya bụ asọmmpi kọwara na eze.ndi Mossi, Naba Baongo kpụnyere ya ebili ahụ ụbọchị Mọnde.

Ọ gbara onye nke atọ site na ịwụ̀ ogo ruru mita iri n’asaa n’ụma iri isii n’isii (17.66m) na Doha ebe ọ nọkwa were tijie ndebe atụ (record) o debebụrụ dịka Ọkaibe asọmmpi ‘triple jump’ na mba Afrịka.

N’asommpi egwuregwu mba Afrịka, e mekwara afọ a na Rabat, mba Moroko, Zango wụtakwara ogo mita iri n’isii n’ụma iri asatọ n’asatọ (16.88m) iji nweta onyinye ọlaedo, nke mere ka ọ bụrụ onye Bọkịna Faso nke mbụ na-eturu ugo n’asọmmpi ahụ.

N’okwu ya, Zango kwupụtara obi ụtọ ya obi onye mbụ na mba Bọkịna Faso na-enweta onyinye nturugo n’Asọmmpi Ịgba ọsọ Mba Ụwa, “E nwere m olileanya na ọtụtụ onyinye nturu ugo ndị ọzọ ga-esochi nkea azụ.”

Unu ahụla ya, ma ọ bụrụ Naịjiriya, e jiri ala dịpụtara adịpụta n’Abụja ma ọ bụ Legọs were naa ya aka.

Leave a Reply

Your email address will not be published.