GỌỌMENTI IMO AGAGHỊ EKWE KA ASỤSỤ IGBO NWỤỌ – ỤLỌ NZUKỌ OMEBEIWU IMO STEETI

Spread the love

Owere  – Rt. Hon. Okey Onyekanma, Osote Ọnụ na-ekwuru Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Imo Steeti akọwaala na Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Imo Steeti nakwa Gọọmenti Imo Steeti agaghị ekwelata ka asụsụ nwụọ.

Onyekanma kwuru nkea ụbọchị Mọnde n’ụlọ ọrụ ya, oge ọ na-anabata otu nhazi maka ịmalite Oluigbo- Rediyo ọbaozi asụsụ Igbo (Igbo internet radio) nke onye nọ n’isi ya bụ ochie dike n’ọrụ nta akụkọ, Ichie Onyebuchi Onyeikegbulem.

Na mbụ n’okwu ya, Onyebuchi Onyeikegbulem sịrị na ha bịara ịkọwara ya etu ha si akwado mmemme mmalite ụlọ mgbasa ozi ahụ nke a ga-ejikwa mee ncheta ịgba afọ ise nke mmemme atọ Aku Obidinma na-emegasị na rediyo.

Ichie Onyeikegbulem kwuru na Oluigbo bụ atụmatụ si n’ echiche Mazị Aku Obidinma (Abdul), onye bụkwa Nnukwu Odeakwụkwọ Mgbasa ozi nke Osote Ọnụ na-ekwuru Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Imo Steeti.

O kwukwara na Oluigbo ga-enye aka mee ka asụsụ Igbo ghara ịnwụ, ọ kacha n’etiti ndị Igbo bi mba ofesi.

Ụfọdụ ndị nwere agba ga-abịa ya bụ mmemme gụnyere : Rt. Hon. Emeka Ihedioha,AKA na-achị Imo Steeti (Onye ọbịa pụrụ iche), Ichie Nnia Nwodo, Nnukwu Onyeisi, Ohaneze Ndigbo (Onyeisi Oche mmemme) tinyere Eze Samụwelụ Ohiri, Onyeisi Oche, Ọgbakọ ndị Eze n’Imo Steeti (Nna mmemme).

Ọzọkwa, Ọkammụta Gregori Ibe, Chanselọ nakwa Onye nhiwe, Mahadum Gregori, Uturu, Abia Steeti ga-enye nkụzi ụbọchị ahụ nke isiokwu ya bụ “Iso usoro mgbasaozi ọbaozi were kpọghachi asụsụ Igbo nke na-efuzi efu”

Rt. Hon. Okey Onyekanma kpọkuru ndị nne na nna ka ha hụ na mkparịta ụka ha na ụmụ ha bụ n’asụsụ Igbo. O kwekwara nkwa na Ụlọ Nzukọ Omebeiwu iwu ahụ ga-eji usoro imebe iwu were kwalite asụsụ Igbo.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.