WAYO WHATSAPP:NDỊ UWE OJII AKPỤRỤLA ONYE NHAZI OTU MKPARỊTA ỤKA WHATSAPP

Spread the love

Kaduna -Ndi Uwe Ojii na Kaduna akpụrụla Mazị Devid Musa, onye nhazi (admin) otu mkparịta ụka whatsapp na Kaduna n’ụbọchị Fraịdee gara aga.

Nke a bụ maka na ndị wayo siri n’otu mkparịta ụka whatsapp ahụ were nweta otu nwanyị, Oriakụ Mercy Okon onye ha gwulahụrụ ego dị Puku Narị Naira Abụọ n’iri ise (N250,000).

Kaosiladi, ndị Uwe ojii jideziri ya bụ onye wayo ọbaozi (internet scammer), oge ọ bịara ịdọrọ ya bụ ego n’ụlọ akụ.

Mazị Devid, onye nhazi otu whatsapp ahụ, site n’ozi hoo!haa!! nwetara gbapụtara onwe ya n’aka ndị Uwe Ojii ka ọ rahụchara n’ụlọ mkpọrọ ha otu ụbọchị.

Ihe e ji kpụrụ ya bụ maka na ọ bụ n’otu mkparịta whatsapp ahụ ka ndị wayo ahụ tinyere ozi azụmahịa (advert) maka ahịa adịgboroja ha ji anapụ ndị mmadụ, ndị dabara n’ọnya ha ego.

Ọ bụ n’otu mkparịta ụka ahụ ka onye wayo ahụ nọrọ zute ma kọọrọ nwanyị maka ahịa oke uru ahụ o jiri rata ya.

Ya bụ, ndị nhazi otu mkpakọrịta, ma ọ bụ whatsapp, Facebook  Twitter, wdg kwesịrị ka uche ha dị ya tupu mmadụ a taa ahụhụ maka ihe ọ maghị isi ya.

Onye nhazi ọbụla chọpụtara akara ekwentị a gbanwere agbanwe kwesịrị isochi onye ahụ azụ ozigbo. O nwere ike bụrụ na ndị wayo ọbaozi atapuola(hacked) akara ekwentị onye ahụ.

Ihe ọzọ ha ga-emezi bụ iji akara ekwentị ọzọ dochie nke onye ahụ ha tapuru akara ekwentị ya ma hapụkwa onyonyoo onye ahụ ebe ahụ.

Ndi nọ n’otu mkpakọrịta ahụ ga-eche na ọ ka bụ onye ha ma ka ha na ya na-akpakọrịta.

Onye wayo ahụ ga-amalitezi ido ndị nọ na otu mkpakọrịta ahụ, ịma onye ha ga-eri.

Leave a Reply

Your email address will not be published.