N’IMO, IKUZI IGBO BỤZI IWU N’ỤLỌ AKWỤKWỌ NILE RUO MAHADUM

Spread the love

Owere – Gọọmenti Imo Steeti e meela ka ikuzi Igbo bụrụ iwu n’ụlọ akwụkwọ nile nọ na steeti ahụ. 

Kọmishọna Steeti ahụ na-ahụ maka Agụmakwụkwọ, Ọkammụta Viola Ọnwụ liri, kwuru nkea na mmemme nnabata ụmụ akwụkwọ ọhụrụ nke Kọleeji Imo Steeti na-ahụ maka ndị nọọsụ nakwa iji ime dị n’Ọ̀lụ̀.

Kọmishọna ahụ, onye nke onye nlekọta na-ahụ maka Agụmakwụkwọ mahadum, Mazị Basịlị Iwu nọchịtere anya ya kwuru sị,

“Anyị ekpebiela na nkuzi asụsụ Igbo ga abụ iwu n’ụlọ akwụkwọ nile dị n’Imo Steeti. Ma Praımarị, Sekọndịrị nakwa mahadum.

“Ụmụ anyị kwesịrị ịma ntọala ha. Ikuzi ha asụsụ anyị ga-enye aka ime nkea. Ndị nne na nna kwesịrị ịna ekuzi ụmụ ha asụsụ Igbo n’ụlọ”

Ọ gwazịrị Onyeisi mahadum ahụ ka ọ hụ na-emere ka nkuzi asụsụ Igbo bụrụ iwu na Kọleeji ahụ. 

Kemgbe Rt. Hon. Emeka Ihedioha batara n’ọchịchị dịka Aka na-achị Imo Steeti, ịkwalite asụsụ Igbo apụtala ihe dịka otu ebumnuche Gọọmenti Imo Steeti.

Leave a Reply

Your email address will not be published.