ỤBỌCHỊ SAYENSỊ MBAỤWA: NAỊJIRIYA EJIGHỊ SAYENSỊ KPỌRỌ IHE-CHIBUIHEM

Spread the love

Legọs – Mazị Stanli Chibuihem, otu onye e jiri sayensị mara ekwuola na Gọọmenti Naịjiriya ejighị Sayensị na nkanụzụ kpọrọ ihe chaa chaa.

O kwuru nkea n’ụtụtụ ụbọchị Mọnde, na mmemme News Hub nke ụlọ mgbasa ozi SilverbirdTV nke gbadoro ụkwụ na Ncheta Ụbọchị Sayensị mbaụwa nke e mere ụbọchị ụka. Otu mbaụwa (UN) wepụtara abalị iri nke ọnwa Nọvemba afọ ọbụla ka Ụbọchị Sayensị Mbaụwa.

O kwuru na ụta adịghịrị ndị si na Naịjiriya erubeghị ogo ikwu okwu ụgbọala latrik.

“Ọ na-abụ nwata gbechaa igbe tupu ọ gaa ije were bịa gbawa ọsọ. Kedu ka anyị ga-esi na-ekwu okwu ụgbọala latrik ebe anyị enweghị ọkụ?

“Site n’afọ 2003 Naịjiriya gara mba Rọshịya, ịga ụgbọelu rọkeetị NIGCOMSAT1, gịnị mere na Naịjiriya ezipubeghi ndị be anyị ka ha gaa ọzụzụ n’ala bekee iji nwee ike ịnọ be anyị were na-agbapụ ụgbọelu rọkeetị na Naịjiriya

O kwukwara na Dọkịnta Ogbonnaya Ọnụ, Mịnịsta na – ahụ maka Sayensị na nkanụzụ na-agbalị mana na Gọọmenti anaghị akwado sayensị na nkanụzụ etu kwesịrị ekwesị.

Cheta na usoro mmefu ego ala Naịjiriya nke afọ nyere mpaghara sayensị na nkanụzụ ego dị ijeri naira iri anọ n’asatọ n’ụma (N48. 1bn) nke pere oke mpe iji tụnyere ego mpaghara ndị ọzọ nwetara.

Chibuihem, onye edemede na-ede maka sayensị n’akwụkwọ akụkọ Daily Telegraph kwara arịrị na etu ndị Naịjiriya siri leghara sayensị anya n’agbanyeghị na ọ bụ sayensị na nkanụzụ bụ ntọala akụnụba mba ọbụla

“Leenụ, ụlọ akwụkwọ Sekọndịrị tuuru ugo n’asọmmpi mgbakọ na mwepụ (mathematics) bụ cowbellopedia, onyinye nturu ugo ha nwetara bụ sọọsọ atachịrị ego nde Naira abụọ (N2m) ebe onye tuuru ugo na mmemme ihe nkiri anya ‘Big Brother Naija’ nwetara akatamkpo ego dị nde naira iri isii (N60m).

“Kaọdịtaa, ọtụtụ ndị Omenka (engineer) na ndị ọzọ gụrụ sayensị na-arụzị n’ụlọ akụ. Ndị a bụ ndị kwesịrị ịnọ na – eme  nyocha dị iche iche iji kwalite sayensị na nkanụzụ n’ala anyị”

Chibuihem kọwara na o nweghị mahadum ọbụla na Naịjiriya nwere akaramgwa nnyocha electronic telescope.

O kwuru na Gọọmenti kwesịrị itinye ego na ịhụ na ụlọ akwụkwọ Sekọndịrị na mahadum n’ala anyị nwere akarangwa zuru ezu maka ọmụmụ sayensị na nkanụzụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.