MAKA ỊBỤ ONYE ỌCHA :NWATAKỊRỊ NWOKE AGBAALA NNE NA NNA YA AKWỤKWỌ

Spread the love

Amerịka – Na Sentị Luwis, Missouri, otu nwatakịrị nwoke dị afọ iri n’asaa, Antoni Dwight agbaala nne na nna ya akwụkwọ maka ịmụ ya dịka onye ọcha.

Antoni na-ekwu na ya nọ n’ihere kemgbe ndụ ya maka na a mụrụ ya dịka onye ọcha.

“Oge m bụ nwata, a na m anọ ogologo oge ịsa ahụ iji sachapụ akpụkpọ ahụ m dị ọcha, mana o kweghị apụ,” Antoni chetara na mwute.

Ọ jụrụ ndị nta akụkọ sị, “Ọ bụ na ndị ọcha nọ n’ụwa a ezubeghi? Ọ bụ na ahụhụ, mmegbu na ịkpa oke anyị butere n’ụwa a ezubeghi? ”
Nne na nna ya sị na ọ tụrụ ha n’anya oge ha nụrụ na nwa ha nwoke gbara ha akwụkwọ. “Anyị chọrọ ka nzuzu a bie, ka ọ lọtakwa ụlọ. Anyị hụrụ gị n’anya  n’agbanyeghị ụdịrị ọcha gị” nne ya na-arịọ ya.


Rọbọt Hoffman, Ọkaikpe ya na-ekwu na onye ọ na-ekwuchitere ataala ahụhụ sitere n’oke echiche nakwa agụụ igbu onwe ya maka ihe ọ kpọrọ “ikpe ọmụma sitere n’ikike pụrụ iche ndị ọcha nwere”.

Antoni Dwight, onye chọrọ ịgbanwe aha ya dịka Jamal Freeman, chọkwara ka nne na ya kwụọ $20,000 iji mee ka akpụkpọ ahụ dịzịa oji.

Hmm, onye nọrọ ebe ọ nọ, ebe ọ nọghị a na-agụ ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.